'Nchutu Madumere nọ n'aka ọkaikpe Imo Steeti'
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Imo Steeti: Ọfọrọ ọnwa atọ ka achabie ikpe Madumere

Ndị ụlọomeiwu Imo steeti mere nzuko n'isi osote gọvanọ ha bụ Eze Madumere ma kpebie na ọ bụ ọkaikpe nke steeti ahụ ga-ekwu ma ọ ga-apụ n'oche ọchịchị n'ime ọnwa atọ.

N'ajụjụ BBC Igbo gbara onyeisi ndu ndị ụlọomeiwu nke Imo steeti bụ Lugard Osuji n'ekwentị.

O kwuru na ọ bụ akwụkwọ mkpesa ka edere n'isi Madumere nke gụnyere ịgbanarị ọrụ ya, agaghị nzukọ nakwa ịtụ asị na ọ gaghị ụlọ mkpọrọ tupu eduo ya n'iyi ọrụ.

Osuji kwuru na ha chọpụtara na Madumere dara iwu mana okwu gbasara ịchutu ya dị n'aka ọkaikpe nke Imo steeti.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọkaikpe ga-eme nyocha banyere nke a n'ime ọnwa atọ ma kpebie ma a ga-achutu Madumere ma ọ bụ agaghị achutu ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: