Ụlọikpe atụọla ndị Boko Haram 113 mkpọrọ

Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009. Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009.

Ụlọikpe pụrụiche na-ahụ maka ihe banyere iyi ọha egwu bụ nke Bekee kpọrọ "terrorism" tụrụ mmadụ 113 mkpọrọ maka ha dara iwu megidere iyi ndụ egwu.

Ndị a amara ikpe nwetere oge dị icheiche mgbe akpụpụtara ha n'ụlọikpe pụrụiche dị n'ọdọ ndị agha Naịjirịa dị na Kaịnji, Naịja steeti.

Iwu a sịrị ndị a dara gunyere ị so n'otu Boko Haram, izo ozi ga-enyere ndị ọrụ nchekwa obodo aka, inyere ndị otu oyi egwu aka ma soro mee ihe ga-eyi obodo egwu, nke butere ogbugbu mmadụ.

Ndị ikpe a metụtara gụnyere Kabiru Mohammed, bu onye Kaban-Magadan, dị na Funtua, Katsina steeti. Eboro ya ebubo na azụru ya maka iji ogunigwe na ihe iyi egwu ndi ọzọ. Ndị nchekwa kwukwara na o so mkpa ike na Bama, Konduga, na Baga dị na Borno steetị nakwa Damaturu dị na Yobe steeti.

Mohammed kwuru na ya banyere Boko Haram n'afọ 2013 ma bụrụ onyeisi.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Boko Haram a nwụchiri n'afọ 2009

E kwuru na o du ndị ọzọ ga mwakpo mmadụ na obodo.

Mohammed gbakwara ama na ọbụghị mmadụ kwanyere ya ịba Boko Haram, mana onwere mgbe ike ụdịrị ndụ ha na-ebi gwụrụ ya ike, nke mere ojiri tụfọ egbe ya wee gbaje Katsina.

Anwụchịrị ya na 2015 n'ọdọ ụgbọala na Katsina. O kwenyere na ebubo asaa eboro ya nke mere eji tuọ ya mkpọrọ mkpụrụ ọka ruo afọ 30.

Ụfọdụ ndị ọzọ atụrụ mkpọrọ bụ Adamu Mohammed dị afọ 22, ma bụrụ onye Gombe steetị.

Eboro ya ebubo na o gburu mmadụ isi ma tụọ ogbunigwe n'ime ahịa. Mohemmed kwenyere na ya gburu mmadụ isi, ma kwuo na ọ bụ n'ime iyi ka ọ tụnyere ogbunigwe ahụ.

Ya na onwe ya nwetere afọ 25 na mkụrụ ọka.

Image copyright Huw Evans picture agency
Nkenke aha onyonyo Ihu foto ndị Boko Haram a na-achọ achọ

Banzana Yusuf, bu onye Kano, nwetere afọ 20 maka etu aka ya siri dị na ntọrọ umu Chibok n'afọ 2014.

Otu onye ndị DSS kpọrọ "ezigbote onye Boko Haram" bụ Sabo Kyari Mohammed, nwetere afọ isi na mkpọrọ. Ekwụrụ na Mohammed na-agbara ndị Boko Haram ama ma soro mee mwakpo akpọrọ "operation pointand kill" na Bekee na obodo ya bụ Misau di na Borno steeti. Ndi agha nwụchịri ya na nwụnye ya na umu ya na Platu steetị.

Zainab Idris, bụ nwunye onye isi agha Boko Haram akpọrọ Babawo, sọ na ndị a amara ikpe. Anwụchịrị Zainab Idris ka ọ na-aga Sambisa, bụ ebe di ya nọ.

Gọọmentị Naịjirịa na-akọwa na ha emeriela Boko Haram n'atụtụmatu Bekee kpọrọ "technical deafeat", mana otu a ka na-akpa ike na ọwụwa anyanwụ nke ugwu Naịjirịa.

Ndị ọzọ na-akpa ike na Naịjirịa ugbua bụ ndị a na-eche na ha bu ndị Fulani na-achi ehi.

Ọtụtụ mmadụ anwụọla na-aka ndị a na ebe dị icheiche na Naịjirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a