Omenaala Igbo ọ ga-ekwe nwoke zaa aha nwunye ya?

Ejiji ndị ndị Igbo pụụ iche nke ụkwuu Image copyright Teyannasecret/Instagram
Nkenke aha onyonyo Ejiji ndị ndị Igbo pụụ iche nke ụkwuu

Onye mba Afrịka chọọ ịza aha nna nwunye ya, e nwere ike ịchị ya ọchị maka mkpebi o mere, maka na ọ bụghị ihe ntị na-anụkarị na mpaghara a.

Ndị Afrịka ọkachasị ndị Igbo, na-ewere ya na ọ bụ ezigbo ihe ka nwaanyị gosi na ọ lụọla di ma o bido ịza aha di ya.

Naanị ọbere pasentị ndị mmadụ bụ ndị na-anaghị atụgharị aha e ji mara ha tupu ha alụọ di, ebe ọbere pasentị bụkwa ndị na-etinyekọta aha di ha na nke nna ha ọnụ.

Nwoke ọ ga-aza aha nna nwunye ya n'ala Igbo?

Ọ bụghị omenaala ndị Igbo na nwaanyị ga-aza aha di ya dịka usoro Bekee na-akpọ 'surname' mgbe gboo, mana ugbua, ndị Igbo anabatala usoro Bekee ji eme ya. Nwaanyị na azazị aha di ya, mere o ji bụrụzịa omenaala nke ọgbara ọhụrụ.

Ya mere, ọ ga-abụ ihe mgbawoju anya ma nwoke Igbo sị na ọ bụ aha nna nwunye ya ka ọ ga-aza.

Ndị ụmụnna ya nwere ike inyocha ya ka ha nwee ike ibo nwunye ya ebubo na o ji ọgwụ kechie ya. Ha nwekwara ike iwe ya na ọ gọpụla onwe ya n'ezinaụlọ ha, ma bụrụzịa onye ezinaụlọ nwunye ya.

Ajụjụ dị iche iche bụ ihe ụmụnna ya ga-akpụ n'ọnụ dị ka:

  • Ọ ga-ahapụ iketa oke n'ụlọ nna ya? N'ihi na ọ bụ aha ya ga-enye ya ikike iji eketa oke.
  • Ọ ga-ahapụ ezinaụlọ ya kwaba biri nakwa bụrụ onye ezinaụlọ nwunye ya?
  • Ndị ezinaụlọ nwunye ya a ga-ahapụ ya ka ọ banye ma bụrụ onye otu nzukọ ha?
  • Ọ ga-eketanwu oke dị ka ala na ụlọ n'ezinaụlọ nwunye ya?

Mana, mgbe ochie, e nwereike jiri aha nwaanyị a ma ama, mara di ya. Ọmụmaatụ: Ọ bụru na "Nwaanyị Ọcha" bụ nwunye Okechukwu, ma bụrụkwa onye a ma ama, a ga amaatụ Okechukwu ka "Okechukwu Nwaanyị ọcha". Nke bụ etu Igbo ji akpọ aha.

Ya mere onye odee akwụkwọ a ma ama bụ Chimamanda Ngọzị Adichie jiri kwuo na "aha nna" adịghị oke mkpa n'ala Igbo na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere.

O kwuru nke a oge a jụrụ ya ihe kpatara o ji aza aha nna ya n'agbanyeghị na ọ lụọla di.

Image copyright Getty Images

Ọ sị na ụfọdụ ndị na-ekwu na enweghị ihe o ji omenaala Igbo kpọrọ kpatara o ji ọnaghị aza aha di ya; mana "ha amaghị na n'ezie 'aha nna' adịbughi n'ala Igbo mgbe gboo, ọ bụ ndị Bekee wetere ya".

Ihe ndị mmadụ kwuru maka ịza aha nwunye ha

BBC Igbo jụrụ ndị mmadụ ọnọdụ nwere ike ime ka ha zaa aha nna nwunye ha, lee ihe ha kwuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a