IPOB: Ihe ndị mmadụ sara Chimamanda maka okwu 'referendum'

Chimamanda Ngozi Adichie Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Adichie bụ ode akwụkwọ turu ọtụtụ ugo di icheiche

Chimamanda Ngozi Adichie na BBC Igbo nwere mkparịtaụka metụtara ihe di icheiche, ọkachasị nke metụtara ala Igbo, na mbido afọ a.

Na mkparịta uka ahụ, anyi jụrụ ya maka akụkọ banyere etụ ojiri hụ ihe mere mgbe ụfọdụ ndi mmadụ na-akwado Ipob jiri aha ya tinyere n'okwu okwughi.

N'aziza ya, Adichie gwara anyị na iwe ya bụ na ndi a ji aha ya tụo asị, bụ ihe okwuru na ọ dịghị mma.

Mana, na-ịga n'ihu, Adịchie kwuru na ya kwenyere n'ihe bụ isiokwu Ipob ji na-aga, bụ nke metụtara na obodo Naịjirịa adịghị enye ndị bi na ya ohere iche na ha so na obodo a.

Adichie kwukwara na agbanyeghị na ya amaghị ihe Ipob sị na ọ ga abụ usoro a ga-eji hazịe onọdụ ndị Igbo na andị ọzọ na Naịjirịa, ọkachasị ebe oke Baifra ga-adị, okwuru na uche ya bụ na ụzọ a ga-eji ga bụ ihe Bekee kpọrọ "True Federation"

Ihe "True Federation" pụtara

"True Federation" bụ usoro ochi nke ga-enye steeti dị icheiche ikike inwe onwe ha n'ụdị inwe ịbụ aka jị akpa ego na-akụnaụba dị n'ala ha, ma na-enye gọọmentị etiti nwa ego.

Ọ bu usoro a ka Naịjirịa jiri bido ndụ ka mba nwere onwe ya n'afọ 1960.

Ndị agha chabiri atụmatụ a mgbe ha nara ndị ndọrọndọrọ ọchịchi n'ike na 1966.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ihe a Adichie kwuru

Nd ịmmadụ na-ekwu na Adichie amagaghị ihe ọ ga-ekwu maka Ipob na Biafra.

Image copyright Chijioke Onyekachukwu

Ndị ọzọ kwukwara na Adichie adịghị asụ Igbo ọfụma, makana ọ na-etinye Bekee na Igbo ọ sụrụ.

Image copyright Eze Igbo Guinea

Mana, onwere ndi ọzọ sị na ndị mmadụ kwesiri ige ntị n'ihe Adichie na-ekwu makana ọ na-ekwu ihe ziri ezi.

Image copyright Engine Onye'isuuwku N'ebu

N'ikpeazu ihe ọpụtala bu na Chimamanda Ngozi Adichie bụ onye Igbo na-ege ntị ma bụrụkwa onye onu ya na.

Akụkọ ga-amasị gị