Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ: Miyetti Alla agbarụọla ihu na mkpebi ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ

Akụkọ ndị dị mkpa.

Ndị ọchị ehi agbarụọla ihu na mkpebi ndị Gọvanọ mpaghara ọwụwa-anyanwụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo E gbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgụ dị n'etti ndị ọchị ehị na ndị ọrụ ugbo

Otu Miyetti Allah nke mpaghara ọwụwa-anyanwụ agbarụọla ihu maka mkpebị ndị gọvanọ mpaghara ahụ mere na ha ekweghi ịmapụta oke ala maka ịzụ ehi.

Onye ndu otu ahụ bụ Alhaji Gidado Siddiki kwuru na mkpebi a juru ha anya agbanyeghi mmekọrịta udọ dị n'etiti ha na Gọvanọ ndịa.

Atụọla ndị Boko Haram dị 113 mkpọrọ ọka

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Boko Haram a nwụchiri n'afọ 2009

Ụlọikpe na-ahụ maka ndị na-eyi ndụ egwu atụọla ndị Boko Haram dị otu narị na iri na atọ mkpọrọ maka nsonye ha n'iyi ndụ egwu.

Gọọmentị etiti mara ndị a ikpe n'ụlọikpe pụrụiche dị n'ogbe ndị agha Wawa Kaịnji nke Naịja Steeti.

Na Mba ofesi

Image copyright Getty Images

Di na nwunye ndị Naịjirịa bi na mba Ịngland agbanahụla nchụlata dịka ha gwara ndị ọrụ njem na mba ahụ na a ga-ebi ụmụ ha ndị nwaanyị ugwu ma ha lọta na Naịjirịa

Ụlọikpe ndị ọrụ njem na Mba Ịngland ga-eleba anya na mkpesa ha n'ime ọnwa Ọktoba nke afọ a.

Egwuregwu:

Image copyright Getty Images

Mba Kroeshịa ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu gbapụ Ịngland iji rue agba ikpeazụ nke mbụ ha n'asọmpi Iko Mbaụwa

ha mere nke a site na goolu ndị si n'aka Ivan Perisich na Mario Manzukich.

Gee nkeji nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Uche m bụ ị nye ọtụtụ ntọrọbịa Igbo ọrụ'