A na m eji nwayọọ agụ akwụkwọ - Buhari

Buhari Image copyright Getty Images

Na mkparịta ụka Buhari na Cyril Ramaphosa onyeisiala mba Saụt Afrịka nwere, o kwuru na ọ ga-etinye aka n'akwụkwọ mkpebi ndịisi mba Afrịka mere n'ọnwa mee n'oge na-adịghị anya.

Buhari katọọrọ ndị na-akpọ ya 'Baba go slow' kwuo na ọ bụ maka na ọ na-eji nwayọọ agụ akwụkwọ mere o tinyeghi aka n'akwụkwọ ahụ ọsịịsọ.

O kwuru na mkpebi a bụ n'iji hụ na enwere ohere ọrụ, ngwa ahịa na ije ozi dị mma na Naịjirịa.

N'okwu ya "Ana m eji nwayọọ agụ akwụkwọ, maka na m bụ onye agha, agụghị m akwụkwọ a nkeọma na mbụ tupu ndị ọrụ m ahụta na ọ dị mma ka m tinye aka n'aya. Aga m etinyeaka n'akwụkwọ a n'oge na adịghị anya."

Cheta na ọtụtụ ndị Naịjirịa na-akpọ onyeisiala bụ Mohammadu Buhari 'Baba go slow' kwuo na ọ naghị eme mkpebi n'oge.

Na-ebokwa ya na agwa ya kpatara Naịjirịa jiri dị etu ọ dị ugbua.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a