Ndị omeiwu akatọọla ogbugbu e gburu mmadụ 39 na Sokoto steeti

Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndịagha Naịjirịa na ọrụ nchekwa na Plateau, Benue na Steeti ndi ọzọ

Mwakpo emere n'obodo Dogonyero nke dị na okpuru ọchịchị Rabah na Sokoto steeti tata isi mmadụ 39, dịka Gọvanọ steeti ahụ bụ Aminu Tambuwal siri kwuo.

Gọọmentị steeti ahụ likọtara mmadụ 32 ọnụ n'ime ndị a nwụrụ ụnyaahụ.

Mkpa mkpa kpara tinyere Sokoto n'ụdịrị ọnọdụ agbataobi ya bụ Zamfara steeti nọ.

Cheta na mwakpo obodo, ogbugbu mmadụ na mmebi akụnaụba a na-ebo ndị Fulani na-achị ehi bụ ihe na-emesi ike na Zamfara, Benue, Platu nakwa Kaduna.

Mana, Sokoto dị bụ oyi tupu ndị omekome a akpa ike a ha kpara.

N'ụlọ omeiwu ukwu nke Naịjirịa, Adamu Aliero na-anọchịte anya etiti Kebbi, na Aliyu Wamakko na-anọchịte anya ugwu Sokoto kwalitere atụmatụ ka ụlọọmiwu katọ ogbugbu mmadụ a.

Ụlọomiwu gakwara n'ihu katọ ihe a mere ma sị ka gọọmentị etiti zipụ ndị nchekwa ka ha ga rụọ ọru nchekwa obodo na steeti ahụ.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Nsogbu ndị ozuu ehi atala isi ọtụtụ ndị mmadụ na Zamfara steeti

Ha sị; "ka gọọmentị etiti nye ndi agha elu na ndị uweoji na-eji ụgbọelu ka ha ga mee nyocha na Sokoto, Zamfara na Kebbi iji chọpụta ebe ndị omekome a zoro, ka ememina ha."

Ndị a mere mwakpo bụ ndị a na-eche na ha so ndị nọ n'ime ohịa na Zamfara akpa ike kemgbe afọ abụọ gara aga.

Ndị a egbuola ọtụtụ mmadụ na steeti Zamfara, Kebbi nakwa Kaduna.

Ha na-ejikarị ọgbatụmtụm aga.

N'otu aka ahụ, Tambuwal sị na nke a bụ mbụ ụdịrị ihe na-eme na steeti ya, ma kwuo na ndị omekome a abịaghi izu ohi, "ha bịara igbu mmadụ na ịkwasa ihe".

Etu mmachị ọchị ehị si aga na Naịjirịa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMmachị ọchị ehi

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a