Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ: PDP Imo na Abia steeti emeela ngagharị iwe.

Akụkọ ndị dị mkpa.

PDP Imo na Abia emeela ngagharị iwe

Image copyright Reuters

Ndị Pati PDP nke Imo na Abia Steeti buru ngagharị iwe gaa n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na Steeti ha dị iche iche ụnyaahụ.

Ha sị na ọ bụ maka nsogbu dị n'etiti gọvanọ Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose na ndị uweojii.

Ha kọwakwara na mwakpo asị na-emere Fayose bụ mmetọ ugwu ruru ya.

Gọvanọ Aminu Tambuwal etiela mkpu akwa

Image copyright Getty Images

Gọvanọ Sokoto Steeti bụ Aminu Tambuwal etiela mkpu akwa na mwakpo mere na Steeti na nso nso a ataala isi mmadụ iri atọ na itoolu.

Mwakpo a mere n'ọchịchị ime obodo Rabah so n'otu n'ime mwakpo ndị merela na mpaghara ugwu nke Naịjirịa.

Akụkọ Mba Ofesi

Image copyright AFP/GETTY

Praịm Mịnịsta mba Britain bụ Theresa May kwuru na atụmatụ Brexit bụ ohere Mba Uk na Amerịka nwere iji zụkọta ahịa

Mana Donald Trump ekwuola n'ụsọrọ May ji chọọ ime Brexit nwereike igbochi azụmaahịa n'etiti mba UK na Amerịka.

Egwuregwu:

Image copyright Getty Images

Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa gara mba Rọshịa ikiri asọmpi Iko Mbaụwa atọla n'ebe ahụ, akụkọ kwuru na ụlọọrụ ha si n'aka ha mee njem a kagburu akwụkwọ njem nlọta ha

Otu ngalaba na-enyere ndị mmadụ aka na Rọshịa enyeela aka ịkpọla mmadụ iri ise ebe ihe karịrị narị abụọ ka fọrọ.

Gee nkeji nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe onyonyo nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Uche m bụ ị nye ọtụtụ ntọrọbịa Igbo ọrụ'