Ụmụ Igbo karịrị asatọ sonyere na ndị ọkaiwu SAN

ndị ọkaiwu
Nkenke aha onyonyo SAN bụ ugwu kachasị ugwu a na-enye onye ọkaiwu pụrụ iche na Naijiria

Ụmụ afọ Igbo gunyere George Igbokwe, Madu Abuchi, Emmanuel Achukwu, Kenneth Ahia, sonyere na ndị ọkaiwu e bulitere n'ọkwa ọkaibe dịka ndị ọkaiwu nke a kpọrọ 'Senior Advocates of Nigeria (SAN).'

Ndị ọzọ bụ Louis Alozie, Sonny Wogu, ọkammụta Offorinze Amucheazi, Edmund Obiagwu nakwa Cosmas Enweluzo.

Kọmitii ndị ọkaiwu na-ahazi nturuugo nke a kpọrọ 'Legal Practitioners' Privileges Committee (LPPC) ' bulitere ndị ọkaiwu 31 n'ọkwa 'SAN'

Onyeisi ọrụ ụlọikpe kachasị ( Chief Registrar of the Supreme Court) bụ Hadizatu Mustapha, bụ onye kwụpụtara nke a ụbọchị Tọọsde.

O kwuru si: "N'ọgbakọ nke agba nke 133 nke e mere n'abalị 12 ọnwa Julaị ebuliela ndị ọkaiwu iri atọ na otu ịbanye n'ime ụlọ.

"Nturugo 'SAN' bụ nzere na-egosi ọkaibe nke a na-enye ndị ọkaiwu ndị gosirila onwe ha dịka ọkaibe na ikpe nakwa agụgmagụ iwu."

Ndị ọzọ soro nweta nturuugo 'SAN' bụ Wole Agunbiade, Essien Udom, ọkammụta Oluyemisi Bamgbose, ọkammụta Waha Egbewole, Olubowale Taiwo, Oluwole Iyamu, Adekole Olawoye, Stephen Adehi na Oluseun Akinbiyi.

Ndị ọzọ bụ ọkammụta Isa Chiroma, Metong Urombo, ọkammụta Olanrewaju Fagbohun, Johnson Ojo, Adeyinka Olumide-Fusika, nakwa Olayode Delano na Tanimu Inuwa.

Ndị ọzọ bụ Isiaka Mudi, Ikhide Ehighelua, Adewale Atake, Mosediq Kazeem, ọkammụta Muhammed Mustapha-Akanbi na Olabode Olanipekun.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara