Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ: Ndị Ekiti apụtala ime ntuliaka

Akụkọ ndị dị mkpa.

Ndị Ekiti ga-eme ntuliaka iji họpụta aka ga-achị ha

Nkenke aha onyonyo Ndị mmadụ aputala maka ntulika Ekiti

Taa bụ oge ndị Ekiti ga-aga ịkwụrụ na-aghịrị na-aghịrị mmakụ ntuliaka nke ha ga-eji họpụta ndị na-achị ha.

Mmadụ iri atọ na anọ na-azọ ọkwa ka gọvanọ, mana ọ bụ Kayode Fayemi nke APC na Kolapo Olusola nke PDP ka ọtụtụ anya ndị anọghi na Ekiti na ele.

Ndị ndọrọndọrọ na-eke ego n'Ekiti ụnyaahụ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption#Ekitielection: Ego ọ chị ọgbọ na ntuliaka Ekiti?

N'akụkọ yiri ibe ya, ndị ntaakukọ BBC nọ ọrụ na Ekiti ụnyaahụ hụrụ ka ndị mmadụ na agba aga ebe a na-eke ego maka ntuliaka nke taa.

Ndi BBC gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ọ bụ puku ano puku anọ ka a na-enye onye ọbụla ji akwukwọ ntuliaka bụ PVC maka ịzụta votu.

Ụmụ Naịjirịa tọọrọ na mba

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Sammy Davies bụ onye na anọchịte anya Naịjirịa na Rọshịa na ndị Naịjirịa na Rọshịa tata

Ụmụafọ Naịjirịa otu nari na iri isii tọọrọ na mba Libya ruru ọdọ ụgbọelu Murtala Mohammed na Legos ụnyaahụ

Ka onyeisi ndị NEMA bụ Mustapha Maihajja na-etinye ọnụ na isi ike ndị gabigara na Libya, ọ sị ha chefuo ajọọ agwa akpasịri ha, ma tinye olinanya na echi ga-adịmma.

Nke na eme ka ozi na-abata na mmadụ ruru nari abụọ gara ikiri iko mbaụwa, tọọrọ na Rọshịa

Egwuregwu:

Na ya bụ Rọshịa taa, aga-ama mba ga-apụta dika ndị nke atọ n'iko mbaụwa.

Ndị ga asọ mpị a bụ Ingland na Belgium. Mgbacha ga-abu eche mgbe Kroeshia na Fransi ga-ezute.

Gee nkeji nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ikọ mgbe ọbụla

Ihe onyonyo nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Uche m bụ ị nye ọtụtụ ntọrọbịa Igbo ọrụ'