Ekiti Election: Ka ntuliaka ndị Ekiti si ga taata

Nkenke aha onyonyo Ọ bụ na Ward 6 Emure Ekiti ka nke a mere

Akụkọ na-apụta n'ebe akpọrọ 'Ward 6' n'ime obodo Emure Ekiti n'Ekiti steeti na-ekwu na ndị omempu abataala n'obodo ahụ ebe a na-e,me ntuliaka ị họpụta gọvanọ steeti ahụ na kwa kposasiri n'ebe niile.

Akụkọ a kọwara na ugbua, ndị uweojii na-achụ ndị omempu a ọsọ n'ike.

N'ime obodo Okehinmi, ndị na-akwado APC na PDP na-atụ onwe ha aka maka ihe ndị ntaakụkọ anyị gosiri n'ihe onyonyo na o nwere ndị na-enye ndị chọrọ ị binye aka n'akwụkwọ puku naira anọ dịka ego mmeru aka.

Ndị chọrọ ibinye aka n'akwụkwọ na-ebekwa akwa na sọsọ ndị chọrọ ibinyere otu APC aka n'akwụkwọ bụ ndị a nyere ohere ibinyere aka n'akwụkwọ, ihe bụkwa ihe ndị ntaakukọ anyị hụru n'ebe ahụ.

Na Ward 7, unit 5, nke dị na St Andrews Primary School, Oke Ila, Ado Ekiti, ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ chọrọ ibinye aka n'akwụkwọ. Akụkọ kọwara na ndị uweojii nwuchiri ha maka ha na-atamu ntamu na ndị 'party agents' na-ebinyeri ndị agadi aka n'akwụkwọ.

Ndị uweojii jidekwara onye ntaakụkọ BBC na-ese foto, ma nyụchapụ foto niile o sere na kamera ya. H mechakwara nyechie ya igwe foto ya.

N'obodo a kporọ Okehinmi, ndị chọrọ ibinye aka n'akwụkwọ bokwara ndị APC na ndị uweojii na ọ bụ sọsọ ndị chọrọ ibinyere APC aka n'akwụkwọ bụ ndị enyere ohere ibinye aka n'akwụkwọ.

Ndị ntaakụkọ anyị na-ekwu kwa na ụgbọala ruru iri abụọ bụ ihe butere ndịagha bata steeti a n'ehihie taa.

Ebe ka ndị agha a na-aga?
Nkenke aha onyonyo Ebe ka ndị agha a na-aga?

Ọ bụ n'elekere iri na abụọ nke ehihie ka ndị ntaakụkọ anyị hụrụ ndịagha a.

Ndị agha a buru ngwa agha dị icheiche
Nkenke aha onyonyo Ndị agha a buru ngwa agha dị icheiche

'Card reader' ekweghi ka onye na-azọ ọkwa ọchịchị gọvanọ nke otu PDP ka o binyere aka n'akwụkwọ.

Nkenke aha onyonyo Eleka na-agba ajụjụ ọnụ ihe mmere 'card reader' ahụghị ọrụ

'Card reader' ekweghi ka onye na-azọ ọkwa ọchịchị gọvanọ bụ Olusola Kolapo Eleka nke otu PDP ka o binye aka n'akwụkwọ n'ụtụtụ ụbọchị mbinye ntuliaka a.

Ọ bụ n'aka elekere itoolu n'ụtụtụ ka Eleka pụtara ibinye aka mana 'card reader' ahụghị akụkọ dị n'akwụkwọ ntụlịaka ya, Eleka jiri iwu pụọ n'ebe ahụ.

Ọkammụta Eleka gwara BBC na ya ga-emeri na-ntuliaka a naanị na ya ebinyere aka n'akwụkwọ.

Nkenke aha onyonyo Ugbua ka o binyere aka n'akwụkwọ

Oge o mesi ka INEC nyere Eleka ohere ibinye aka n'akwụkwọ n'ejighi 'card reader'.

Nkenke aha onyonyo Mana onye otu APC bụ Kayode Fayemi ebinyeela aka n'akwụkwọ ka mgbe

Ọtụtụ ndị mmadụ pụtara taa maka ntuliaka a, INEC kwuru na ha di njikere maka ntuliaka a, na kwa na ha na-atụ anya na mmadụ ruru puku isi ga-apụta ịme ntuliaka taa.

Akụkọ ga-amasị gị