Kayode Fayemi: Ntuliaka a bụ nke kachasị kwụrụ ọtọ na Ekiti

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNtuliaka a bụ nke kachasị kwụrụ ọtọ n'Ekiti

Kayode Fayemi ekwuola na obi dị ya ụtọ etu ntuliaka e mere n'Ekiti nke họpụtara ya dika gọvanọ si gaa.

O Kelekwara ndị niile nyere ya nkwado mgbe ọ na-azọ ọchịchị onye ga-abụ gọvanọ steeti ahụ ma kwo na ya bụ ntuliaka kachasị kwụrụ ọtọ karịa nke e merela na steeti ahụ mbụ.

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kelekwara Fayemi maka mmeri ya na ntuliaka Ekiti e mere n'ụbọchị 14 nke ọnwa Julai.

Buhari kelekwara ndị otu ndọrọndọrọ APC ka ha si wee kwado Fayemi.

N'otu aka ahụ, Buhari kelekwara ndị Ekiti maka etu ha si wee pụta n'udo bịa binye aka n'akwụkwọ ntụliaka ahụ ma kwukwa na nke a gosiri na ndị Ekiti kwenyesịrị ike n'ọchịchị onye kwuo uche ya.

Na ntuliaka ndị mmadụ ga-akpọ ndọrọndọrọ n'Ekiti steeti, Inec kpọputara aha onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC bụ Kayode Fayemi dịka onye mmeri ntuliaka a.

Nkenke aha onyonyo Akwụkwọ ntuliaka na-egosi na Fayemi meriri

INEC kwuru na Fayemi ji vootu ruru 197,459 wee merie otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ so na ntuliaka a nke ịzọ oche gọvanọ Ekiti ebe onye otu PDP Ibe ya o ji vootu ruru 19,338 gafee bụ Kolapo Olusola, nwetere vootu ruru 178,121.

Nke a ga-eme ya ugboro abụọ Fayemi na-emeri dika gọvanọ nke Ekiti steeti.

Fayemi meriri na 2010 ma chịruo afọ 2014.

Image copyright Kayode Fayemi/Facebook
Nkenke aha onyonyo Fayemi Chịbụrụ Ekiti site n'afọ 2010 ruo afọ 2014

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na Soshal midia

Onye ntaakụkọ ama ama bụ Dele Momodu ekeleela Kayode Fayemi na Twitter maka mmeri ya.

Ọchịchị Kebbi ekeleela Fayemi.

Onye ọkaiwu ama ama kwuru na ụwa na-eche Ayodele Fayose ka ọ kpọọ Fayemi kelee ya maka mmeri a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a