'Boko Haram emerighị anyị'-Ndị agha Naịjirịa

Ndị agha Naịjirịa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Oteela ndị agha Naịjirịa jị awakpo ndị Boko Haram

Ndị agha Naịjirịa ekwuola na akụkọ kwuru na a wakporo ndị agha na Bama dị na Boronu steeti ma nara ha ụgbọ agha ha bụ asị.

Ha depụtara ihe a n'akwụkwọ sitere n'oche ọnye na-ekwuchitere ndị agha Naịjirịa ọnụ bụ Texas Chukwu.

Ha kwuru na ya bụ akụkọ na-edughie ndị mmadụ ma bụrụkwa nke e gbasasiri karịa ihe merenụ.

Ndị agha Naịjirịa kwuru na ha ji ohere a ekwe ndị bị n'ugwu Awụsa nkwa na onweghị ihe mebirinụ kama nchekwa ha ka kwụ chim.

Ha kwuru na ọ bụ eziokwu na Boko Haram wakporo ha ma chọkwa ịnara ha ngwaagha ha mana ndị agha Naịjirịa meriri ha.

Ha kwuru na ha gburu ihe ruru ndị otu Boko Haram 22, ebe ụfọdụ ndị egbe a gbara agba meruru ahụ gbara ọsọ.

Ndị agha Naịjirịa kwuru na etu ọ dị ụgbua, na ha na-agba mbọ ịhụ na e jidere ndị otu Boko Haram ndị ọzọ gbara ọsọ.

Ha kwukwara na ndị agha meruru ahụ site n'egbe a gbara ha mana ha na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.

Ndị agha Naịjirịa dọkwara ndị ntaakụkọ aka na ntị ka ha kpachara anya ha maka ịdughịe ndị mmadụ n'akụkọ ha enyochaghị enyocha.

Cheta na akụkọ anya hụrụ mgbe ihe a mere kwuru na ndị Boko Haram anwuchiela ndị Naịjirịa 600 ma napụ ha ngwa agha ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a