Ihe ọma e merela ụmụ Naịjirịa tọrọ na Rọshịa

Ndị tọọrọ na Rọshịa Image copyright Yulia Siluyanova
Nkenke aha onyonyo Ndị tọọrọ na Rọshịa ruru mmadụ 200

Onye ọgbasa ozi onyeisiala Naịjirịa bụ Garba Shehu denyere n'akara ya na Twitter na Buhari agwala Minista na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama ka ọ hazie etu a ga-eji kpọlata ụmụ Naịjirịa tọọrọ na Rọshịa.

Ndị a tọọrọ so na ndị gara ikiri iko mbaụwa, mana ọtụtụ n'ime ha tọọrọ mgbe ha ruru ebe ahu chọpụta na ndị aghụghọ aghọgburu ha.

N'ozi a o dere, Shehu sị na onyeisiala sị ka eme ihe niile a ga-eme n'ịhụ na ndị a lọtara.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na Onyeama amalitela ọrụ n'ịhụ na ihe gara etu onyeisiala siri kwuo.

Ma kwukwa na ihe a na-eme bụ site na-etu onyeisiala jiri chọ ịhụ na ndị Naịjirịa nwetara nchekwa ebe ọbụla ha nọ n'ụwa.

Cheta na BBC dere maka ndị tọọrọ na Rọshịa n'ụbọchị Satọde.

Gọvanọ na-achị Legọs bụ Akinwumi Ambode kwụru ụgwo ka mmadụ 50 tọọrọ na Rọshịa lọta.

Yulia Siluyanova, bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndi a na-emegide na Rọshia, gwara BBC Igbo na obi dị ya ụtọ, ma kwukwa na ha ga-ahụ na ndị a tọọro ga na-eri nri ruo mgbe ha malitere njem ịlaghachị Naịjirịa.