Mobil na-akpaso anyị agwa ka ndị amaghị oke ruru ha - Ndị a chụrụ n'ọrụ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị ọrụ Exxon Mobil ebeela akwa arịrị

Kemgbe ụbọchị Fraịde nke izuụka gara aga, ndị na arụbụ ka ndị nchekwa n'ụlọọrụ ExxonMobil gbachiri ụzọ isi ụlọọrụ ahụ na Legọs ebe ha na-eme ngagharị iwe maka ihe ha kwuru bụ mmegide ekwesịghị ekwesị e mere ha.

Ihe ruru mmadụ otu narị na ọma gwara BBC na n'agbanyeghi na ụlọikpe ukwu gwara ExxonMobil ka o mee ha etu e kwesịrị ime ndị na-arụrụ ha ọrụ, ụlọọrụ ahụ kachiri ntị chụọ ha n'ọrụ.

Onyeisi ndị na-eme ngagharị iwe bụ Stephen Ashemudaga, gwara BBC Igbo na ndị nọ ngagharị iwe a bụ ndị nọ ọrọ na Legọs. O kwuru na e were ha n'ọrụ na Mobil, na ọ bụghị uweojii ka ha bara.

"Mana, ka anyị batara, ndị Mobil zigara anyị ka anyị gawa ọzụzu n'ụlọ akwụkwọ ndị uweojii Naịjirịa, makana ha sị na ha chọrọ ka anyị yie uwe ndị uweojii iji chekwaa ha ọfụma," Ashemudaga kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na Mobil mechara sị ha na ha bụ uweojii, mana ndị uweojii gwara ha na enweghi etu ha si bụrụ ndị otu ha makana ha eweghị ha n'ọrụ.

Na nkọwa ya, ihe ha ji gbachie ụlọọrụ Mobil bụ ka ha nye ha ihe ruru ha.

Akụkọ ndị ga-amasị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a