Osibanjo gara Kastina maka ide mmiri

Kastina steeti na Ide mmiri Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ide mmiri a gbachibidoro obodo 15 mgbe akwammiri jikọtara ha gbabiri maka ajọ ide a

Oke mmiri nke bidoro n'ime abalị Sọnde ruo nwanne ụnyahụ na okeala Nije na Naịjirịa butere ide mmiri nke tara isi mmadu 52 dịka ndị ọrụ gbatagbata steeti ahụ siri kwuo.

Akwụkwọ ndị otụ a depụtara na-ekwukwa na ihe ruru mmadụ 20 na-efukwa efu.

Akwụkwọ nta akụkọ Guardian na-egosi na ọ ga-ahịaahụ ịmatacha mmadụ ole ihe a metutara maka mgbe ya bụ njinji jiri.

Sụpiri sụpiri ya dị na akara a dị n'elu.

Mkpa mkpa ya bụ ide mmiri kpara dị egwu nke bu na ọnụọgụ ndị nwụrụ ụbọchị ahụ omere esila 44 gbagoruo 52 ụnyahụ osote onyeisiala, Yemi Osibanjo na Gọvanọ steeti ahụ bụ Bello Masari gara ebe ahụ maka iti ndị ya bụ ihe metutara aka n'obi.

Ya bụ ide mmiri kwatukwara ihe ruru ụlọ 500 ma chụpụkwa ihe ruru 5,000 n'ụlọ ha.

Ya bụ ọnụọgụ ndị nwụrụ nke a na enyo enyo sitere n'ọnụọgụ ozu mmadụ ahụrụ ebe ahụ.

Akụkọ a na-akọwa na ya bụ ide mmiri buuru ọtụtụ mmadụ na ehi ụra na be ha n'abalị ahụ.

Gọọmenti ekwela nkwa ịnyere ndị ya bụ ihe a metutere aka.

Osote onyeisiala, Yemi Osibanjo, kwuru na gọọmenti etiti, nke steeti ahụ nakwa NEMA ga-etikọta aka nwere nyere ndị ya bụ ihe metutara aka.

Osibanjo gwakwara ndị steeti ahụ na nna ya ukwu bụ Onyeisiala Buhari siri ha dere juu na gọọmenti etiti ga-agbatara ha ọso enyem aka ma kwekwa nkwa na ụdị ihe ahụ agaghịzị abịakwute ha ọzo.

Ide mmiri metutere ihe ruru obodo iri na Jibia distrikt nke mere mgbe iyi dị na obodo ahụ gbara iji were kwobata n'ime obodo, dịka onyeisi gbata gbata ndị SEMA steeti ahụ bụ Aminu Waziri siri kwuo.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara