E mere ngaghari iwe megide ịchụtu osote Rochas

Eze Madumere Image copyright Channels TV

Ndị Imo steeti pụtara n'igwe mee ngagharịiwe n'Owerri ,isiobodo Imo steeti megide atụmatụ ịchụda osote Gọvanọ steeti ahụ bụ Eze Madumere.

Ndị ngagharịiwe ahụ bidoro n'Orlu Road gaa n'ụlọ omeiwu nke Imo steeti sị ebe ahụ gaa bank Road ma kwụsị na Government Roundabout.

Ha bukwa akwụkwọ na-egosi iwe ha.

Ụfọdụ ihe akwụkwọ ndị ahụ na-ekwu gụnyere: "Rochas kwụsị ịranye ndị ụlọomeiwu ka ha chụda osote Gọvanọ" ; "Imo steeti abụghị ụlọahịa Okorocha na ezinaụlọ ya"; "Rochas, kwụọ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa."

Ngaghariwe ahụ butere mgbachi nye ndị ọkwọụgbọala oge a na eme ya.

Otu onye bị n'Owere achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC na "ndị mere ngagharịiwe ahụ bụ ndị sị okpuru ọchịchị ndị dị n' 'Owerri Zone'

Madumere, osote Gọvanọ steeti ahụ bụ onye Mbaitolu nke dị n'Owerri Zone'

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rochas mere nwanne ya nwaanyị onye Kọmishịọna na-ahụ maka obi ụtọ nke Imo Steeti

Cheta na n'izuụka gara aga, ndị ụlọomeiwu Imo steeti mere nzuko ma kpebie na ọ bụ ọkaikpe nke steeti ahụ ga-ekwu ma osote gọvanọ ha bụ Eze Madumere ọ ga-apụ n'oche ọchịchị n'ime ọnwa atọ.

Esemokwu dapụtara n'etiti Madụmere na Okorocha n'ihi ndọrọndọrọ onye ga-anọchị Okorocha ma oge ya dịka gọvanọ zuo. Ebe Ọkorocha chọrọ ka ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu nọchie ya, Madụmere nwere mmasị ịzọ ọkwa ahụ ma ọkorocha rituo.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: