Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Enwebeghị onye mere mkpesa maka ebubo e boro Adeosun - Uweojii

Isiokwu ndị dị mkpa n'ụtụtụ a

Ebubo Kemi Adeosun

Ndị mmadụ echefuola maka ihe gbasara ebubo mmerụaka asambodo ndị NYSC e boro Kemi Adeosun bụ minista na-ahụ maka ego na akụnaụba Naịjirịa?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Adeosun ṅụrụ iyi ọrụ dịka minista n'afọ 2015

Ka ụbọchị ole na ole e boro ya ebubo a gachara, ndị uweojii ekwuola na ha agaghị enyochanwu ya bụ ebubo maka na enwebeghị onye bịara mee mkpesa n'aka ha.

Jimoh Moshood bụ onye na-arụ ka osote kọmishọna ndị uweojii gwara onye ntaakụkọ Punch na ndị uweojii amaghị maka ebubo a.

Ọ sị "Anyị ga-enwetarịrị mkpesa, nke e dere ede maọbụ jiri ọnụ kwuo. Ị ga-edegara ụlọọrụ ndị uweojii nke divishọnal maọbụ Kọmishọna uweojii maọbụ onyeisi ndị uweojii Naịjirịa niile akwụkwọ; anyị anatabeghị mkpesa ọbụla, ya mere anyị agaghị enyochanwu ya."

Ndị Ide mmiri metụtara

Image copyright Getty Images

Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo agaruola Katsina ileta ndị oke ide mmiri mekpara ahụ.

Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ iri ise nwụrụ ebe ụlọ ruru narị ise mebiri ma mee ka ihe ruru mmadụ puku ise ghara inwe ebe ha ga-edewe isi.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Osibanjo gara Kastina maka ide mmiri

Nelson Mandela

Ọ dị ndụ taa, Nelson Mandela bụ onye ji onwe ya chụọ aja maka nwere onwe ndị a na-akpa oke agbụrụ ma bụrụkwa aka chịbụrụ mba Saụt Afrịka, gaara adị afọ otu narị taa.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mandela nwụrụ n'afọ 2013 oge ọ dị afọ 95

Mana ụfọdụ ndị ntorobịa Saụt Afrịka BBC gbara ajụjụọnụ maka ndụ ya na-akatọ ụfọdụ ihe ndị o mere oge ọ dị ndụ.

N'egwuregwu

Wayne Rooney dị afọ iri atọ na abụọ ekwuola na o kwetara ịgbara otu DC United nke Amerịka bọọlụ maka na ọ chọghị ịbụ ibu nyịrị danda nye otu Everton.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rooney gbaara Everton afọ atọ, 2002-2004 na 2017-2018

Cheta na Rooney gbaara otu Manchester United bọọlụ afọ iri na atọ.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Lee ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwagbọghọ ji otu ụkwụ agba egwu

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a