Aloysious Katsina-Alu, bụbu onye ọkaikpe na Naịjịrịa anwụọla

Ihe e ji egbuchi ikpe n'ụlọikpe Naịjirịa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Anabatara Aloysious-Alu n'ụlọikpe ukwu Naịjirịa n'afọ 1998

Onye bụbu ọkaikpe ukwu na Naịjịrịa bụ Aloysious Kastina-Alu anwụọla mgbe ọ gbara afọ 76.

Akụkọ kọrọ na ọ rịatụrụ ọbere ọrịa tupu ọ nwụọ n'ụlọọgwu dị n'Abuja.

Nta akụkọ Pilot kwuru na onye kwuputara maka ọnwụ oke mmadụ a bu onye enyemaka pụrụ iche nke onye ọkaikpe ụkwụ Naijirịa nọ n'ọrụ ụgbụa aha bụ Walter Onnoghen.

Ya bụ onye enyemaka pụrụ iche bụ Awassam Bassey, kwuru na o nwetere ozi n'aka odeakwụkwọ onye ọkaikpe ukwu maka ọnwụ Kastina-Alu ụbọchị Wenezde.

Anabatara Ọkaikpe Aloysius-Alu n'ụlọikpe n'afọ 1968. Ka otu afọ gafechara, a nabatara ya n'ụlọikpe nke ndị Briten na 1967.

Ochie dike a bụ onye Ushongo na Benue Steeti malitere ọrụ dịka onye ọkaikpe ukwu nke Naịjirịa n'afọ 2009.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a