Ụka Anglịkan Aguata: Anyị agaghị agba nwaanyị dị ime akwụkwọ

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Ụlọụka CMS na diocese Aguata dị na Anambra steeti eburula bata 18

Ha kwuru na ha agaghị anabata nwaanyị dị ime ịgba akwụkwọ maọbụ ndị bikọrọ ọnụ tupu ha alụwa.

Naịjirịa

Iwe ji ndị Owere na-achọghị ka e wepu osote gọvanọ ha bụ Eze Madumere.

Ndị Owere wuchiri ụzọ na ngaghari iwe iji gosipụta na obo adịghị ha mma gbasara ya bụ ihe chọrọ ime na steeti ahụ.

Cheta na a chọrọ iwepụ Madumere nke ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa kwurula na ọ bụghị ihe ziri ezi.

Ebe ọzọ na Naịjirịa

Ị makwa aha a kpọrọ ụgbọelu ọhụrụ gọọmenti etiti na-amalite?

Gọọmenti etiti kpọrọ ya 'Nigeria Air' ma kwuo na ọ bụ njịkọ aka gọọmentị na ụlọọrụ ndị anọghị na gọomentị ka ugboelu a siri pụta.

Akụkọ mba ofesi

Ọgụegwu mba Briten bụ Cliff Richard emeriela BBC n'ikpe gbasara mwakpo ya bidoro n'afọ 2014.

Nkọwa foto,

Cliff Richard ekwughi ọtụtụ okwu oge e kpesiri ikpe ahụ

Ụlọikpe kpebiri ka BBC kwuo Cliff ego ruru nde naịra iri itoolu maka mmejọ e mejọrọ ya site n'akụkọ BBC dere na 2014 oge ndị uweojii na mba UK na-enyocha ya gbasara ebubo na ọ metọrọ nwa nwoke.

N'egwuregwu,

Roma ekwetela iresi otu Liverpool onye oche bọọlụ ha bụ Allison n'ọnụ ego ruru nde paụnds iri isii na isii.

A na-atụ anya na Liverpool na Allison ga-enwe mkparịta maka ego ole a ga-akwụ ya nakwa ihe ndị ọzọ.

Cheta na a wara ya isi nke gbata gbata maka ọbara na-agba ya n'ụbụrụ n'ụbọchị Satọde.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo,

Nwagbọghọ ji otu ụkwụ agba egwu