Ịgba onye dị ime akwụkwọ bụ ịgba mmadụ atọ akwụkwọ - Ụkọchukwu

Ndị na-agba akwụkwọ Image copyright Getty Images

Dayọsịs na-ahụ maka ụka Anglịkan niile nọ n'okpuru Aguata n'Anambara steeti ekwuola na ha agaghị anabata nwaanyị ọbụla dị ime ka ọ gbaa akwụkwọ n'ụlọụka.

Nke a so na ngụpụta Bishọp dayọsis ahụ bụ Chukwudi Ezeofor n'ọgbakọ mbụ nke sinọd ise dayọsis ahụ.

Bishọp Ezeofor gbadoro ụkwụ n'ụzọ ihe atọ:

  1. Ha agaghị agbazi nwaanyị ọbụla dị ime akwụkwọ
  2. Ha agaghị ekwe ka ndị bikoro ọnụ gbaa akwụkwo
  3. Ha agaghị agba mmadụ akwụkwọ ma ọbụrụ na ha emesighi omenaala niile banyere alụm di na nwunye.

N'ime mkpebi atọ ndị a, nke na aboli uzu bụ nke mbụ na nke abụọ nke kwuru na ha agaghị agba ndị bikoro nakwa nwaanyị dị ime akwụkwọ.

Otu ụkọchụkwụ n'ime dayọsis ahụ bụ Ven Chukwudi Osondu kwuru na mkpebi bụ maka na ọtụtụ ụmụnwoke na-ama Chukwu aka n'ihu site n'ikwu na ha chọrọ ịma ka nwunye ha aga atụli ime tupu ha agbaa akwụkwọ.

Osondu kwuru na ụdị ihe a bụ ịma Chukwu aka n'ihu maka na nwaanyị dị ime nwere ike nwa ya apụọ maọbụ nwa ahụ anwụọ agbanyeghi na ha emetọọla akwa alụm di na nwunye ha dịka akwụkwọ nsọ siri kwuo.

Otu ihe ọzọ pụrụiche ọsọndụ kwukwara bụ na agbam akwụkwọ bụ n'etiti mmadụ abụọ bụ di na nwunye mana ọ bụrụ na nwaanyị ahụ dị ime, ị mara na ọ bụ n'etiti mmadụ atọ maọbụ anọ.

Image copyright Anglican Diocese of Aguata/ facebook
Nkenke aha onyonyo Agụata abụghị naanị dayọsis ga-eti iwu a

N'okwu ya: "Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ dị ime nwaanyị, ị mara na ọ bụ ụmunwaanyị abụọ na-agba akwụkwọ mana ọ bụrụ na ọ dị ime nwoke, ị mara na ụmụnwoke abụọ na-agba otu nwaanyị akwụkwọ."

Osondu kọwara na ihe a abụghị ihe ziri ezi; "Anyị ga-akọwara ndị ụka anyị ka ha ghọta, anyị anaghị achụpụ mmadụ n'ụlọụka.

"Anyị ga-enye ndị chọrọ ịgba akwụkwọ akwụkwọ ka ha gaa n'ụlọọgwụ ga mee nyocha gbasara ọtụtụ ihe dịka ọrịa obiri n'aja ọcha nakwa ọrịa ndị gụnyere

N'aka nke ọzọ, bishọp Eha-Amufu dayọsis bụ Nkemjika Olinya kwuru na o teela ha bidoro iwu a na dayọsis ha ma ọ na-aga nke ọma.

O kwuru na ndị ụka ha nabatara ya nke ọma ma makwara na ha enweghi ike ịgba akwụkwọ ma ha dị ime.

BBC Igbo gbara otu nwoke na-achọ ịlụ nwaanyị aha ya bụ Aloba Oke ajụjụọnụ. O kwuru na ya nabatakwara iwu ndị ụka ahụ maka na ọ bụ ihe ziri ezi.

Ndị ọzọ nọkwa n'akara Facebook anyị katọọ atụmatụ nwoke na nwaanyị ibiko ọnụ tupu ha agbaa akwụkwọ.

Mana ụfọdụ ndị ntorobịa chere na onweghi ihe o mere ma nwoke na nwaanyị chọrọ ịlụ onwe ha bikọrọ ọnụ tupu ha agbaa akwụkwọ.

Chukwuemeka Okereke nọ n'akara Facebook anyị kwuo na ya nabatara ka nwoke nabata enyi ya nwaanyị n'ụlọ ya tupu ha alụọ.

Ndị ahụ na-ekwu na onye chọrọ ka ya na nwaanyị ya biri tupu ha alụọ abụghị ajọ ihe maka na ha ka ga-alụ.

O kwukwara na ọtụtụ ụmụagboghọ na-eshi ime maka na ha achọghị ka a chọpụta na ha dị ime.

Mana otu ihe ndị ụka ahụ kwuru bụ na nwaanyị dị ime nwereike ịga mụọ nwa, oge ọ mụsịrị nwa, ọ bịa a gozie alụm di na nwunye ha, ọbụghịzi agbam akwụkwọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara