Ndị Igbo a ga-ege Ipob nti maka ntuliaka 2019?

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdi Ipob na ntuliaka 2019

BBC Igbo gbara ndị mmadu ajụjụ ọnụ maka ntuliaka 2019 iji chọpụ ma nke na-eme n'ala Igbo nakwa etu ndị mmadụ ga-eji saa mkpebi Ipob maka ntuliaka 2019.

Onye ji egoachụego n'Aba bụ Chidiebere Ikeh gwara anyị na ike Ipob adịghịzị ka ọ dị na gboo, ma kwuo na ndị Ipob ya ma na-agbata akwụkwọ PVC.

"Ọtụtụ n'ime ha na-akwodo Eyinnaya Abaribe, nke mere ha ji na ahazi ịtụnyere ya na ntuliaka nke 2019," Ikeh gwara anyị

Gee ya ntị n'uju n'elu.

Onye ọzọ anyị gbara ajuju ọnụ bụ Ọgụeri Ishiguzo bu onye otu pati APC n'Imo steeti.

Ishiguzo si na yabụru na ọ bu Ohaneze ndị Igbo wepụtara atụmatụ a, ndị Igbo ga ege ntị, ma kwuo na Ipob enwerezi udiri ikike ha nwere na mbụ.

Gee ntị ihe ọ gwara anyi ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIshiguzo gwara BBC okwu

Cheta na otu na-achọ ka ọwụwa anyanwụ Naịjirịa kewapụ ma bụrụ mba akpọrọ Biafra bụ Ipob agwala ndị ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, ndị etiti Naịjirịa nakwa ndị ndịda mba ahụ ka ha ghara isoro mee ntuliaka nke afọ n'abịa.

Ipob kwuru nke a, n'ime akwụkwọ ozi onye mgbasa ozi ha bụ Emma Powerful zipuru ụnyaahụ, ebe ha sị na nchịkọta otu ruru otu nde aghaghị akwụsịnwu onyeisiala Muhammadu Buhari imeri ntuliaka 2019.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ipob ka na-ewe iwe maka egwu eke ndi agha Naijirịa mere n'Abia steeti

Powerful kwuru n'ime akwụkwọ ozi ahụ na "onweghị mgbe ntuliaka na-ewepụ onyeisiala aka ike n'ụwa", bu ihe mere o kwuo na ọ bụ naanị ịkwụsị ike n'ekweghi ekwe na-ebutu ha.

N'okwu Powerful, ọ sị na ihe Ipob na-eme ugbua bụ ihe ha kwesiri ime, nke bụ ha inweta nwereonwe nke ha, bụ nke ọ sị ga-ebute mkpebi ihe niile dị njọ na Naịjirịa.

Nkenke aha onyonyo Enweghị ọgbaaghara na ntuliaka Ekiti steeti, mana akụkọ kwuru na-egoro ma rekwa vootu

"Ya bụrụ na ndị na-anọghị n'ọchịchi chọ, ha chịkọta otu ruru nde chọrọ ichutu APC, Buharị ka ga-emeri. Makana nchịkọta APC, Inec, ndị agha, Civil Defence na ndi uweojii ka otu ndị ọzọ niille ahụ ike, Ihe ka mma bụ ịghara iso na ntuliaka ọbụla.

"Anyị bụ Ipob na-asị ka aghara ime ntuliaka n'ala Biafra, etiti Naịjirịa nakwa ndịda Naịjirịa niile, maka na ọ bụ sọsọ etu a ka a ga-esi chekwa ndụ ndị mmadụ, kwụsị ahụhụ a na-ata ma enweta udo."

Powerful gakwara n'ihu tinye ọnụ na ntuliaka nke emere na Ekiti steeti n'ime izuụka gara aga, nke ọ sị kwadoro ihe ha na-ekwu.

Cheta na ụlọikpe na Naịjirịa kagburu ma sị na iso na Ipob bu ihe iwu megidere na afọ 2017.

Ahụbeghi onyeisi Ipob bụ Nnamdị Kanu kemgbe ndi agha wakporo be nna ya kemgbe September 2017.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwunye Nnamdi Kanu gwara ndị BBC Igbo na ọ maghị ebe dị ya nọ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a