Ndị ọrụoyibo ga-amata ụkwọ opekatampe ọhụrụ n'Ọgọst - TUC

Ndị ọrụ Enugwu
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ Enugwu na-egosipụta obi ụtọ ha

Onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ oyibo na Naịjirịa akpọrọ Trade Union Congress (TUC) na-aha ịchafụ ekwuola na gọọmenti etiti ga-agwa ọha ihe pụtara n'ọgbakọ ha na ndị kọmiti ehibere maka ịlebe anya na ụkwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ oyibo kpatara ụnyahụ n'Abuja.

Bobboi Kaigama gwara ndị nta akụkọ na ọbaghị uru itupe ya bụ azụ dị na ngwugwu ebe ọbụ na gọọmentị etiti ekwela nkwa ịgwa ọha ego ole a ga-etinyere ha n'ụgwọ onwa dịka ego opekatampe n'Ọgọst afọ a.

Kaigama mere ka amata na ya bụ kọmiti nke gọọmenti etiti hibere ekpebiela ego ole a ga-etinyere ha dịka ego opekatampe nke ha kwetere na a ga-ebido kwuwa n'ọnwa September 2018.

Oteela ndị ọrụ oyibo tụwara anya ka ebuliera ha ụgwọ ọnwa nke e kwetere na-oso n'ụkwọ ọnwa nke kacha nta n'ụwa gba gburugburu, ebe ndị omeiwu Naịjirịa kacha eri ụgwọọnwa n'ụwa nịịle, dịka akụkọ sị kwụọ.

Kemgbe afọ gara aga ka ndị ọrụ oyibo mailitere iti mkpụ ụgwọọnwa opekatampe nke ha na-arịọ ka esi na N18,000 ebulie were ruo N66,500.

Cheta na minista na ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige kwuburu na ibuli ego opekatampe ndị ọrụ abụghị ihe na-eche gọọmenti ha ugbua.

Akụkọ ga-amasi gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a