Dọkịnta Bumbum: A nwụchiela dibia otele ukwu

Furtado na Brazil Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Dọkịnta Furtado sị na ọnwụ nwaanyị ahụ dị nwute

Ama a gbaara ndị uweojii emela ka ha nwuchie dọkịnta Denis Furtado bụ onye asị gbụrụ nwaanyị chọrọ otele ukwu.

Ka ọ dị ụgbụa, Furtado nọ na ụlọ mkpọrọ ha na Rio de Janeiro ezuru nwaike.

Lilian Calixto bụ onye bịara ka o nye ya ukwu sara mbara nwunahuru ya n'aka maka ogwu asị na-ọgbara ya nke kwesiri inye aka ka otele ya buo ibu.

A ga-ekpe Denis Furtado ikpe ọchụ maka nke a.

Akụkọ kọrọ na-ejidekwuru nne Furtado bụ onye a na-eche n'aka ya dị na ya bụ ọdachi.

Ndị na-enyocha ya bụ okwu sị na Dọkịnta Furtado gara ịrụ Calixto gbara afọ 46 ọrụ n'otele ya na-ụlọ be ya mgbe ọgwụ ọ gbara ya bidoro ịnye ya nsogbu.

Dọkịnta Furtado mere ngwa ngwa bụrụ Calixto gawa ụlọ ọgwụ bụ ebe ọ nọ nwụọ, dịka ndị uweojii si kwuo.

Akụkọ kwuru na mgbe o ruru na ya bụ ụlọọgwụ na obi bidoro ịkụsị nwaanyị ahụ ike.

Mgbe ahụ ka Furtado matara na ekwu adagharịala were rịe mbọmbọ ọsọ.

Ụbọchị Wednezde ka ọkaiwu Furtado kwuru n'aka Furtado dị ọcha, na ọ bụ maka obi mmapụ ka o jiri gbaa ọsọ.

Ihe nkiri o kwuru okwu ka ejidechere ya ụnyahụ Furtado sị na onwu Calixto dị nwute maka na ọbụghị taa ka ya bụ oke enwe tawara akwụ n'ohia.

Image copyright Facebook
Nkenke aha onyonyo Lilina Calixto dị afọ 46

Ọ sị na ya arụọla ya bụ ọrụ ihe uru ugboro 9,000 na-ekwukwa na iwu Brazil nabatara ụdị ọrụ ahụ.

A makwa Furtado ama na Brazil nke bụ na mmadụ ruru 650,000 na eso ya n'instagram.

Calixto si be ya na Kuiaba gawa sentral Brazil ụbọchị Satọde ịme ka otele ya bukwuo ibu bụ ebe ọ nọ zute onwu ya were gbahapụ ụmụ abụọ ọmụrụ.

Ndị uweojii kpụrụkwara enyi nwaanyi Furtado bụ onye ha na-eche na ọ na-enyere ya ka n'ọrụ ahụ.

Ndị ụlọọrụ na ahụ maka ahụike na steeti Rio de Janerio sị na ha amalitele nnyocha na ya bụ okwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a