Nigeria Air: Ihe atọ gọọmentị ga-eme ka ụgbọelụ ha rụọ ọrụ

Akara Nigeria Air Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụgbọelu ọhụrụ ga-ebido ọru na ọnwa Decemba nke 2018

Kemgbe gọọmentị Naịjirịa wepụtara atụmatụ ụgbọelu ọhụrụ nke mba ahụ akpọrọ "Nigeria Air", ndị mmadụ emechigbeghị ọnụ n'isi okwu a.

Ihe adịghị atu n'anya n'ihi n'oruola afọ 15 "Nigeria Airways" nwụrụ maka ọtụtụ nsogbu metụtara mpu na awụwọ nkwa ọchịchi adịghị mma.

Agbanyeghi na onwere ndi ka ji akụkụ anya na-ala akụkọ a, onwere ndị ọzọ sị na atụmatụ gọọmentị a bu ihe eji enwe nchekube na echi ga-adi mma, mana gọọmentị kwesiri ịmụta na mmeghe nke ochie.

Onye ọnụ ya na-eru n'okwu maka ihe banyere ụgbọelu bụ Capt John Ojikutu gwara BBC na otu ihe gbụrụ Nigeria Airways bụ makana ọ bụ ihe gọọmentị nwe.

"Mmadụ niile nọdụ ala na ngalaba na-ahụ maka njem na-enye ndị ụgbọelu iwu, ọtụtụ na ezinaulọ ha na-aba ya n'efu dịka ihe ehiwere Dodan Baracks," Okwuru.

Ihe gọọmentị ga-eme

Na okwu Ojikutu, ụgbọelu ọhụrụ a ga arụ ọrụ ma gọọmentị wepụ ya aka kpam kpam. Mana okwukwara na nchịkọta ọnụ gọọmentị na ndị ojiegoachuego mere dị kwa mma.

"Ka anyị jiri usoro ha jiri mepụta Emirate, Qatar na Ethihad hazie Nigeria Air," Ojikuku kwuru.

Ọ gakwara n'ihu si ka akpọbata "ndị ojiegoachụego si mba ofesi", ka ha jiri mgwa ọru ha bịa.

Ọ si ka enye ha ihe ruru 40%.

"Nweta ihe ruru 20% ndị Naịjirịa na-emesi ihe ike dị ka Dangote, nye ha ohere, ọbughi ndị bịara ha richa ego a gbafuo ma afọ ise gachara," O kwuru.

"Ndị a bịara ugbua anyi nyere ha ijeri naira 300 n'afọ 2012, kedu ebe ego ahụ dị? Kedụ ebe ego ha kpatara n'elu orure akwụkwọ njem? Anyi ga-agbado anya, mana ka gọọmentị etinyerela ego n'ime ya, ka 5% ahụ a na-ekwu okwu ya nwere isi," Ojikutu kwuru.

Ihe ọzọ oti nyere ọnụ bụ na gọọmentị ga enye ngalaba na-ahụ maka ụgbọelu ohere ka ha rụọ ọrụ ha.

Ihe nrite diri Naịjirịa n'ime ihe a

Otu n'ime ihe mere ndi mmadụ nabata atụmatụ a bụ maka ego na ohere agamihu Naịjirịa ga-eweta n'ime ya.

Agbanyeghị ohere dịrị gọọmentị, ndị ntoroọbịa ga-enweta ohere ọrụ n'ime ihe a.

"Naịjirịa Airways nọbụ na-aga ọdọ ụgbọelu iri n'ime Naịjirịa, ọdọ niile na ọdịda anyanwụ Afịrịka, ma asaa nke mba ofesi tupu ọ daa, ugbua ole ka anyi na-eme?"

"Ka anyi gbaa mbọ nweta ụgbọelu nke anyị, nke abụghị nke nkpọrọ maọbụ nke gọọmentị ndi Naịjirịa niile ga-akwado," bụ ihe Capt Akikotu kwuru.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a