Mmadụ 164 tọrọ na Russia amalitela njem ịlọta Naịjirịa

Ebe foto si, Oluremi Kehinde
Oluremi Kehinde (yi uwe manụ manụ) so na ndị na-enyere ndị a tọrọ aka na Rọshịa
Ụgbọelu gọọmentị Naijiria zigara mba Rọshịa ibulata ụmụ Naịjirịa tọrọ atọ eruola Rọshịa, dịka Yulia Siluyanova, bụ onyeisi ndị na-arụ ọrụ n'efu akpọrọ Alternativa, gwara BBC Igbo.
Siluyanova kwuru na ụmụ Naịjirịa karịrị otu narị bụ ndị mbụ n'ime mmadụ tọrọ atọ na Rọshịa eruola ọdọ ụgbọelu nkwado maka ịlota Naịjirịa taa.
E bugharịrị njem ha rue elekere isii nke ụtụtụ taa (elekere nke ndị Rọshịa), ma mecha tinye ya na elekere iri na abụọ nke ehihe maka inye ndị na-akwọ ụgbọelu ohere ezumike tupu ha ebido ịlaghachi.
Ebe foto si, Yulia Siluyanova
Mmadụ karịrị 200 tọrọ atọ na Rọshịa dịka emechiri asọmpị Iko Mbaụwa na Rọshịa ụbọchị ole na ole gara aga.
Ụfọdụ kwuru na e gwuru ha wayo n'ikagbu akwụkwọ njem ha bụ 'ticket' na bekee n'agwaghị ha.
Ebe foto si, Yulia Siluyanova
Ndị a karịrị otu narị ga-abụ mbụ ga-alọta site n'aka gọọmentị Naịjirịa.
Cheta na Alternativa, nke Yulia Siluyanova bụ onye isi ha, kwuru na ha kpọlatara ụfọdụ n'ime ndị a tọrọ, ma na-enyekwa ndị fọrọ nrị.