Di na nwunye irikọ nri: Gịnị ga-eme nwoke Igbo ajụ nri nwunye ya siri?

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGịnị ga-eme nwoke Igbo ajụ nri nwunye ya siri?

N'ala Igbo, di na nwunye na-erikọ nri n'otu efere.

Dịka Ikechukwu Asikadị na ọtụtụ ndị ọzọ ha na BBC Igbo nwere mkparịtaụka si kwuo, ọ na-egosi ịhụanya na ịdịnotu.

Asikadị sị, "Ọ na-adị mma ka nwoke na nwunye ọ lụzuru ọfụma na-erikọ nri."

Mgbe ụfọdụ, enweghị ohere, amaghị esi nrị, ike ọgwụgwụ na ọrịa nwere ike ime nwoke na nwunye aghara ịnọkọ rie nri.

Mana ihe ndị a bụ obere okwu.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Di na nwunye irikọ nri na egosi ihunanya

Nke bụ okwu bụ nwoke Igbo ịjụ idetụ ire na nri nwunye ya siri iji gosi iwe ya.

Dike Asikadi siri kọwaa, iwe maka nnupuisi nwunye ọkachasị nwaanyị ịgba n'ezi, nwere ike ime ka nwoke ghara isonye nwunye ya rie nri.

Uchenna Omeke kwukwara otu okwu ahụ sị, "ọ chọputa na nwunye ya gbara n'ezi."

Image copyright Matsecooks/Instagram
Nkenke aha onyonyo Di na nwunye irikọ nri ọnụ na-egosi ịhụnanya

Nwaanyị lụrụ di ịyị ọyị nwoke ọzọ bụ arụ kwọ nwa n'ala Igbo. E jighị ntị anụ ya.

Nke a bụ n'ihi dịka Asikadi siri kwuo, nwaanyị ịgba n'ezi na-egbu mmụọ nwoke ọkachasị ma ọ bụrụ na nwoke ahụ hụrụ ya n'anya ma na-emekwara ya ihe niile ọ chọrọ.

Nke ka nke dịka Oriakụ Celine Ekere siri kọwaa, na mpaghara Igbo ụfọdụ, nwoke riri nri nwunye ya na-agba n'ezi ji ọnwụ ụgwọ, ma ya ma nwa ha mụtara.

Ekere, onye bụ onye Ezaa n'Ebonyị steeti kwuru na 'Ọ bụrụ na nwaanyị gbaa n'ezi ma ọ lụọ di, ga sie nri nye di ya, di gị rie ya, nwa gị ga-anwụ. Di gị ga-ebido rịawa ọrịa. Oge ụfọdụ, ahụ ga-ejide nwa gị. O nwere ike, aka na ụkwụ ya azaa. Tupu ị mara ihe ga-eme, ọ nwụọ."

Dika ilu Igbo na-ekwu sị, 'onye mara asụ, sụọ a n'ikwe. Onye amaghị asụ sụọ n'ala.

Akụkọ ga-amasị gị: