Anyị anabataghị arịrịọ Joe Igbokwe chaa chaa - ọkaiwu Adegboruwa

Nkenke aha onyonyo Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuchiri otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC na Legos

Joe Igbokwe,odeakwụkwọ mgbasaozi otu APC na Legọs steeti abaala mmiri ọkụ maka ozi o dere n'elu Facebook n´ụbọchị ole n'ole garaaga.

Otu okaiwu aha ya bụ Ebun-Olu Adegboruwa gbara Igbokwe akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu nke Lagos maka na n'ụbọchị 16 n'ime ọnwa nkea, Igbokwe boro gọvanọ na-achị Rivers steeti bụ Nyesome Wike ebubo n'elu facebook na ọ zụrụ mkpebi n'ụlọikpe ụkwu nke Abuja maka okwu gbasara 'Election Petition Appeal' na Bekee, ha zara n'Abuja.

Igbokwe arịọla mgbaghara n'elu Facebook maka ozi a.

O dere na obi gbariri ya agbari maka ozi nkea o dere, na kwa na ọ bụghị echiche ya ị kparị ndị nọ n'isi oche ụlọikpe makana ya akwanyere ha ugo oge niile.

Image copyright Joe Igbokwe facebook

Mana Adegboruwa gbadosiri ụkwụ ike na ya agaghị anabata arịrịọ a Igbokwe dere.

Ọ gwara onye ntaakụkọ anyị n'elu ekwentị na arịrịọ Igbokwe dere ejubeghị ọnụ nke ihicha mkparị ọ kparị ndị na-arụ ọrụ okaikpe na ọkaiwu na Naịjirịa.

Image copyright Ebun-Olu Adegboruwa facebook
Nkenke aha onyonyo Ebun-Olu Adegboruwa bụ okaiwu ama ama na Legos

N'ọnụ okwu ya: "Iwe anyị na ihe Joe Igbokwe dere bụ makana ozi ya emeela ka ndị mmadụ kwụsị ịnwe ntụkwasị obi siri ike n'ihe niile gbasara ndị ọkaikpe na ọkaiwu n'ala anyị. Cheta kwa na ndị a bụ ndị ta ahụhụ ọtụtụ afọ ị gụ akwụkwọ tupu a bụrụ ndị ọkaikpe maọbụ okaiwu"

Adegboruwa kwuru na echiche ya abụghị ka Igbokwo ta ahụhụ na mkpọrọ maọbụ kwụ nha, o kwuru na ọ chọ ka Igbokwu kwupute n'ụlọikpe na Nyesome Wike azụghị mkpebi na ụlọikpe dị na Naịjirịa.

Mgbọ niile anyị mere inweta Joe Igbokwe n'elu ekwenti maka ị sa okwụ a Adegboruwa kwuru amụpụtaghị mkpụrụ.

Ọ zaghị ekwentị ya oge BBC kpọrọ ya.

Ọzabeghịkwa ozi anyị degara ya site n'ekwentị ya.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara