Akụkọ ndị kachasị taa: Erighị nri abalị n'oge na-ebute ọrịa kansa

Erighi nri abalị n'oge na-ebute ọrịa

Image copyright @matsecooks

I makwana na erighị nri abalị n'oge na-ebuite ọrịa ?

Otu kpọrọ onwe ha Barcelona Institute for Global Health na bekee kwuru na nchọpụta ọhụrụ ha mere, na ọ na-ebute izi agede nke a kporọ 'prostrate cancer' maọbụ izi ara nke bụ 'breast cancer'.

Ọbịara ije ma-ụna n'ala Rọshịa

Image copyright Oluremi Kehinde

Naịjirịa na-atụ anya nlọta mmadụ otu narị iri atọ na-anọ tọrọ na Roshia ga-alaghachị azụ na Abuja taa.

Ozi na-eru anyị bụ na abaala ụgbọelu na kwa na ha ga-efadata na Abuja na abalị a.

Joe Igbokwe ga-aza ikpe di n'ishi ya

Otu okaiwu aha ya bụ Ebun-Olu Adegboruwa agbaala Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwụrụ APC na Legos akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu nke Lagos maka na o boro gọvanọ Rivers steeti bụ Nyesome Wike ebubo n'elu Facebook na ọ zụrụ mkpebi n'ụlọikpe kachasị n'Abuja.

Joe Igbokwe arịọla arịrịọ mana Adegboruwa gbadosiri ukwu ike na ya agaghị anabata arịrịọ a Igbokwe dere.

Son ebiyeela aka n'akwụkwọ

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, ọgba bọọlụ Son Heung-min nke otu Tottenham ebinyeela aka n'akwụkwọ ọhụrụ nke otu ya ruo afọ 2023.

Son Heung-min banyere otu Tottenham n'afọ 2015. Ugbua o nyeela goolu ruru iri anọ na asaa.

Gee nkeji anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ikọ mgbe ọbụla

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwagbọghọ ji otu ụkwụ agba egwu