Ịchụ onyenkuzi chọrọ idina nwataakwụkwọ n'ọrụ ezughi -ICPC

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOAU achụọla onyenkuzi ha maka ebubo ndina maka ịgafe ule

Kọmishọn na-ahụ maka ihe gbasara mpụ na mmehie dị icheiche ekwuola na ha anabataghị ọchụchụ achụrụ onyenkuzi chọrọ idina nwataakwụkwọ ya na mahadum Obafemi Awolowo.

Ha kwuru site n'ọnụ kọmishọna na-ahụ maka agụakwụkwọ ha bụ Mohammed Bade na mahadum ahụ kwesiri ị nyocha ọkammụta Richard Akindele maka akụkọ a.

O si "N'agbanyeghị na mahadum achụọla ya (Akindele) n'ọrụ, anyị na-atụ anya na a ga-eme ya nyocha zuru oke ma kpụpụ ya ụlọịkpe maka nke a".

Ọchụchụ ọkammụta OAU: Ọ bụ ihe kwesịrị- Ụmụnwaanyị

'Onyenkuzi kwadara m n'ule maka na ekweghị m"

Gbalahụ idina onye nkuzi gị n'ụzọ ise a

Bade kwuru na ọ dị mkpa iji chekwa ụmụnwaanyị na-agụ akwụkọw na mahadum dị icheiche n'ihi na ụdị omume a buru ibu n'etiti ndịnkuzi na ụmụakwụkwọ mahadum.

Ọkammụta Richard Akindele bụ bu onyenkuzi na mahadum Obafemi Awolowo chọrọ idina nwataakwụkwọ ya tupu ọ gafe ule.

Image copyright OAU Facebook page
Nkenke aha onyonyo OAU bụ mahadum dị n'ọdịda-anyanwụ Naijiria a mara ọfụma

Achụrụ ọkammuta ahụ n'ọrụ mgbe mahadum ya mere nyocha chọpụta na nwata akwụkọ ahụ gafere ule ya ma jide kwa olu ọkammụta ahụ mgbe ọ na-agwa ya na ọ ga-edina ya.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a