Ụmụ Naịjirịa tọrọ na Rọshịa abatala Naịjirịa

Image copyright News Agency of Nigeria

Ụmụ Naịjirịa ruru mmadụ 155 alaghachitela Naịjirịa mgbe ụgbọelu Ethiopia Airlines ET-ALP bu ha wụchiri n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe n'Abuja n'elekere itoolu nke abalị.

Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ NAN si kwuo, otu onye so na ndị a tọrọ atọ bụ nwaanyị ku nwa n'aka gara Rọshịa maka asọmpị ikombaụwa nke malitere n'ọnwa Juun.

Minista na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama nọkwa nso ịnabata ndị a mgbe ha lọtara.

Image copyright News Agency of Nigeria

O ji ohere ahụ kele onyeisiala Naịjria bụ Mohammadu Buhari maka mbọ ọ gbara n'ịhụ na ndị a tọrọ atọ lọtara.

Ọ sị na ọ bụ ya nyere iwu si ka akpọlata ndị ahụ tọrọ atọ mgbe iko mbaụwa gwụrụ n'izuụka gara aga.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee ụmụafọ Naijiria tọrọ na Rọshịa ka ha na-abanye ụgbọelu ịlọta Naijirịa

Cheta na ihe ruru mmadụ 230 bụ ndị Naịjirịa gara n'isiụlọọrụ Naịjirịa dị na Mosko iti mkpu enyemaka maka ọtịtọ ha tọrọ ebe ahụ.

Ụgbọelu bu ha hapụrụ ọdọụgbọelu Domodedovo n'ehihie ụnyaahụ ma rute Naịjirịa n'elekere itoolu nke abalị ụnyaahụ.

Ụfọdụ n'ime ndị a na-ekwu na e gwuru ha waayo n'ịkagbu akwụkwọ njem ha bụ (Ticket) na Bekee.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a