A nwụchiela 'ụkọchukwu' chọrọ ịkpọlite ozu nwụrụ anwụ

Onye na-eme ihe ejije Easter Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ezinaụlọ ahụ nyere ya ikike ịga n'ihu ka ọ kọchaara ha akụkọ Lazarus nọ n'akwụkwọ nsọ

A nwụchiri otu onye chọrọ ịbụ onye amụma n'Ethiopia ka ọ nwachara ike ya ma daa ka ọ na-achọ ịkpọlite otu nwoke nwụrụ anwụ ebe ahụ.

Getayawkal Ayele dinara n'elu ozu onye a kpọrọ Belay Biftu na-eti "Belay, teta" ka ọ na-achọ ikpọlite ya.

Ọ bịaghị na mmezu, nke kpasuru ezinaụlọ ahụ iwe ma mee ka ha bido iti Getayawkal ihe.

Ndị uweojii bịara zọpụta ya, mana o meghị ka ọ laa na nta n'aka ha maka na iji ozu nwụrụ anwụ mee akaja bụ mpụ n'iwu mba Ethiopia.

Otu onye isi ndị uweojii na mba ahụ gwara BBC na ha anwụchiela nwoke ahụ ezigbo ọrụ ya bụ ịrụ ọrụ ahụike nke Bekee kpọrọ 'health worker'.

Ndị mmadụ setere ihe a ka ọ na-eme ma tinye ya na soshal midia, ebe ọtụtụ mmadụ kesara ya.

Ndị bi n'ọbere obodo a kpọrọ Galilee, dị na mpaghara Oromia, kwuru na Getayawkal bu ụzọ gakwuru ezinaụlọ ahụ na-eru uju ma kọọrọ akụkọ Lazarus nke akwụkwọ nsọ kwuru na Jesu Kristi kpọlitere n'ọnwụ.

Ha kwenyere ka e gwulite ili Belay.

Mana ka ọ na-akpọlitenwughị ya, ọtụtụ ndị ezinaụlọ ahụ kubiriume ebe ndị ọzọ ji iwe bido iti Getayawkal ihe tupu ndị uweojii abịa kpụrụ ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a