Boko Haram wakporo anyị n'ezie - Ndị agha Naịjirịa

Ndị Agha Naịjiria Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndịagha Naịjirịa ekwuputaghị mmadụ ole nwụrụ na mwakpo a

Ndị na-eyi ndụ egwu a kpọrọ Boko Haram awakpoola ọdọ ndị agha Naịjirịa nke agba '233 Battalion' n'okpuru ọchịchị Babbangida nke Yobe steeti ụnyaahụ.

Nke a ga-eme ya nwakpo abụọ a ga-eme ndị agha Naịjirịa n'ime abali ole na ole gara aga.

Ndị agha kwuru na ha gbara mbọ napụta ndị Boko Haram ahụ ike n'obodo ahụ ma chụpụkwa ha.

E mefuru ndụ ụfọdụ ndị agha n'ọgụ a lụrụ mana ekwuputabeghi ọnụọgụgụ mmadụ ole nwụrụ na ya.

Dịka ọ dị ugbua, ndị agha elu jisike enyocha mpaghara ahụ ịchọta ndị ka dị ndụ ma ndị oyiegwu na-ezo ezo.

Ndị agha ahụ rịọrọ ndị mmadụ ha ekwela ka obi mapụ ha maọbụ tụọ egwu.

Cheta na a nụrụ kepu kepu na ndị agha ruru mmadụ 28 nwụrụ n'izuụka gara aga ebe ndi Boko Haram wakporo ha ma gbaa ụfọdụ ụgbọ agha ọkụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a