Akụkọ ndị dị mkpa: Ekweremadu chọrọ nhatanha na nkesa ọkwa gọọmentị
Akụkọ dị mkpa taa

Ebe foto si, AFP
Ike Ekweremmadụ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu na mahadu Naịjirịa dị n'Enugu
Osote onyeisi sineti bụ Ike Ekweremmadu ekwuola na otu ụzọ a ga-esi kwalite udo n'ezi obibi na Naịjirịa bụ ịkekọrịta ọrụ, ọkwa dị ịcheiche nakwa ngalaba n'ụzọ dị nhatanha.
O kwuru na atụmatụ a ga-ebute udọ karịa ịkwe naanị nkwa nkịtị.
Ndị uweojii na Legọs anwụchiela mmadụ ise bụ ndị isi otu ndọrodọrọ PDP na Legọs maka ọnwụ otu n'ime ha.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legos kwuru na ọ bụ ọgụ na mgba mere na nzụkọ pati ahụ riri ndụ nwoke ahụ.
N'Afrịka,
Ebe foto si, AFP/Getty
Ụzụ akwa n'atụ na mba Sawụt Afrịka ebe ndị o ji egbe egbu wakporo ma gbuo mmadụ iri n'otu bụ ndị na-anya ụgbọala tagzi.
Ndị uweojii na mba ahụ kwuru na a wakporo ha mgbe ha si akwamozu onye otu ha alọta ma kwuo na mmadụ anọ n'ime ha nọ n'ụlọọgwụ.
N'Egwuregwu,
Ebe foto si, Reuters
Alex Iwobi bụ onye ọgba bọọlụ Naịjirịa na-akwado ibinye aka n'ime akwụkwọ ọrụ ọhụrụ ga-eru afọ 2022 n'otu Arsenal.
N'otu aka ahụ otu Leicester city ajụla ịtọghapụ Ahmed Musa ka o sonye n'otu Al Nasr nke Sawudi Arebịa.
Gee nkeji nke mgbede a:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe onyonyo nke taa:
Onyeoru Air Peace ji asụsụ Igbo atụziaka maka njem n’ụgbọelu si Legọọs na-aga Owere