SARS: Ndị uweojii achụọla ndị otu ha mmadụ anọ?

Osote onyeisi ndị uweojii nọ na Zoonu 2 dị n'Ikeja Legos bụ Adamu Ibrahim akwadola ka a chụlaa ndị uweojii SARS mmadụ anọ maka ebubo na ha zuru ohi nakwa mkpamkpa ndị ọzọ.

Otu onye uweojii welitere isi bụ Abayomi Shogunle depụtara ọchụchụ ha n'akara twitter ya.

Shogunle dere aha ndị a chụụ dịka Sgt. Adeoye Adekunle, Sgt. Adekitan Adebowale, Sgt. Agbi Lucky na Sgt. Odighe Hehosa.

Mana onye nkwuchiteọnụ zoonu ahụ bụ Dolapo Badmus gwara ndị ntaakụkọ na a kpụpụkwara ha ụlọikpe maka iji egbe gaa ohi, ịtọrị mmadụ, ijide mmadụ n'ike nakwa imekpa ndị mmadụ ahụ nakwa iyi ndị mmadụ egwu.

Badmus kwuruna otu kọmitii e kpokobara inyocha ihe ha mere bụ ndị kwuru ka a chụọ ha site na nyocha ha mere maka akwụkwọ ndị mmadụ dere megide ha.

Ọ kọwara na ndị dere akwụkwọ ahụ bụ Chukwudi Godwin Odionye onye e ji aha 'Bishọp" we mara ụbọchị Mee 2, 2018.

N'okwu ya: "Onye dere akwụkwọ ahụ kwuru n'ụbọchị Juun 4, 2017, ọ nọ na be ya oge mmadụ anọ ji ege wụbatara be ya ịnwụchi ya na ọ na-ebu amụma ụgha na ihe ịrịbaama ụgha.

"Oge ha nwụchiri ya, a kpọrọ ya gaa n'otu ụlọoriri na nkwari ebe ha dobere ya ma yie ya egwu na a ga-egbu ya ma ọ bụrụ na o meghi ihe ha kwuru."

Ọ gara n'ihu kọwaa na "Ụbọchị Juun 5, 2017, a kpọrọ ya gaa n'ụlọakụ ebe ha mere ha ka o tinyere ego ruru nde naịra asaa n'ụlọakụ otu n'ime ha.

"Oge anyị nwetara akwụkwọ ahụ, osote onyeisi ndị uweoji nyere iwu ka e lebaa ya anya."

Badmus kwuru na nyocha ahụ gosiri a onweghi usoro ziri ezi nke e soro iji nwụchi Chukwudi.

"Ndị SARS mmadụ anọ ahụ tọọrọ nwoke ahụ n'ụlọ ya ma jide ya megide iwu maka onwe ha" dịka Badmus si kwuo.

O kwuru na onyeisi ha enyela iwu na ha agaghị anabata agwa ọbụla na-ebuda aha ụlọọrụ ha maọbụ na-emchu ha ihu na mba ụwa.

Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nwụchi ahụ na twitter

Adrian kwuru na a ka ga-ahapụ ha etu e kwuo na e jideburu otu onye bụ Festus nke e ji Ijaya mara mana ọ ka na-emekpa ndị mmadụ ahụ.

Segalink kwuru na ntaramahụhụ ha kwesiri ịka mka na ọ bụ gọọmenti nyere ha egbe ha jiri zuo ohi.

Timothy Atori kwuru na nke a kwesiri ikuziri ndị uweojii ndị ọzọ ezi ihe ma kwuo ka Chineke gọzie ndị uweojii Naịjirịa ma gọziekwa Naịjirịa.

O teela aka a na-eti mkpu na twitter nakwa na ngwa soshal midia ndị ọzọ ka e kpochie ndị SARS site n'akara #EndSars.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara