Obi rue gị ala, gọọmentị Anambara zuru ka eme - Okonkwo

Ide mmiri Image copyright Getty Images

Okonkwo gwara BBC Igbo n'ekwentị na ugbua abụghị mbụ a na-ekwu okwu ide mmiri n'Anambara steeti.

N'ọnụ ya "eso m na kọmitii na-ahụ maka ịgbochi idemmiri, ama m ebe e dobere ngwa a ga-enye ndị mmadụ ma idemmiri kwobe".

O kwukwara na ndị mmadụ ekwesighị ịtụ egwu n'ihi na gọọmentị anambara steeti dị njikere oge niile.

Cheta na ndị ụlọọrụ gbatagbata nke a kpọrọ 'National Emergency Management Agency' (NEMA) na Bekee, kwuru na oke idemmiri ga-enye ndị mmadụ nsogbu n'Anambara steeti n'afọ a.

Ndị Nema kwuru na idemmiri a ga-emetụta mpaghara ime obodo ndị dịka Njikọka, Ayamelụm, Ọwụwa-anyanwụ Anambara, Anaọcha, Agụata, Ugwu Idemili, Ọgbarụ, Ugwu Ọnịcha, Ugwu Orumba, Ọdịda-anyanwụ Anambara, Ndịda Ọnịcha nakwa Dunukọfịa.

Onye na-arụ ọrụ dịka onye nchịkọta otu Nigerian Hydrological Services Agency nke ngalaba Federal Ministry of Water Resources bụ Olayinka Ogunwale, kwuputara maka idemmiri a n'Ọka, ebe ha na-eme nzukọ ha na-eme kwa afọ, ebe a na-akọwa olileanya gbasara idemmiri a kpọrọ 'Annual Flood Outlook (AFO)' nke 2018.

Clement Nze bụ onye nọchitere anya Ogunwale na nzukọ ahụ, kpọkuru gọọmentị Anambara nakwa NEMA, ka ha gbalịa hụ na ha mere ihe ga-ebelata oke idemmiri.

Image copyright Getty Images

Ogunwale kwuru na oke idemmiri abụghị ihe a ga-akwụsịnwu na Naịjirịa, mana ịkwado n'oge ga-enye aka ibelata mkpamkpa o nwere ike ịkpa.

O kwukwara na osimiri na-asọbiga oke, oke mmiri ozuzo, na ihe ndị ọzọ dịka ndị mmadụ ịwunye atịtị n'ime ọwara-mmiri, na-etinye aka ibute oke idemmiri.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara