Ndị bu egbe agbagbuola ọkwọụgbọala 11 na South Africa

Ndị ọkwọụgbọ kwụ n'ahịrị Image copyright AFP/Getty Images

Ndị uweojii mba Saụt Afrịka kwuru na ndị omekome wakporo ma gbuo ndị na-anya tagzi 11.

Mmadụ anọ ndị ọzọ merụrụ ezigbo ahụ ka mgbọ egbe tụrụ ha oge ndị omekome wakporo ụgbọala ha ji si akwamozu onye otu ha.

Ụmụnwoke ahụ si mpaghara Gauteng aga Johannesburg oge ihe a mere.

Ndị uweojii sị na ha amaghị ihe butere mwakpo a, mana ihe a ma bụ na ndọrọndọrọ dị n'etiti ndị na-anya tagzi ebutela ọgụ n'oge ndị gara aga.

Jay Naicker bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii kwuru na awakporo ụgbọala ahụ n'etiti obodo Colenso na Weenen.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ sị "A wakporo ụgbọala ahụ. Mmadụ 11 nwụrụ ebe anọ merụrụ ezigbo ahụ ma nọrọ n'ụlọọgwụ.

E nweela ọtụtụ ọgụ n'etiti ndị na-anya tagzi na mpaghara ahụ, mana anyị ka na-eme nyocha ịma ndị kpara mkpamkpa a."

Tagzi so n'ime ụgbọala ndị mmadụ kacha aba na mba Saụt Afrịka bụ mba nde mmadụ 55 mejupụtara.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara