Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ipob gwara ICC "Unu ekwesighị ịkpọ Buhari oku"

Ipob akatọọla ICC maka ịkpọ Buhari oku

Image copyright Getty Images

Ipob akatọọla ụlọikpe mbaụwa na-ahụ maka mpụ bụ 'International Criminal Court' maka ịkpọ onyeisiala bụ Muhammadu Buhari oku ka ọ bịa kwuo okwu n'ọgbakọ ha mere na Hague.

Ha sị na ọ bụ maka mkpọchi ntị Buhari n'ịtọhapụ onye bụbu onye ndụmọdụ nchekwa bụ Sambo dasuki, na onyeisi otu Shiites bụ El-Zakzaki agbanyeghi n'ụlọikpe ekwuola ka atọhapụ ha.

NEMA - Idemmiri ga-eme n'Anambra

Image copyright Getty Images

Ndị steeti Anambra kwesiri ịdị njikere ugbua dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata bụ 'National Emergency Management Agency' (NEMA) ekwuola na oke idemmiri chere ha n'ihu.

Ụlọọrụ NEMA kwuru na idemmiri a ga-emetụta mpaghara ime obodo dịka Njikọka, Ayamelụm, Ọwụwa-anyanwụ Anambara, Anaọcha, Agụata, Ugwu Idemili, Ọgbarụ, Ugwu Ọnịcha, Ugwu Orumba, Ọdịda-anyanwụ Anambara, Ndịda Ọnịcha nakwa Dunukọfịa.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Oke idemmiri na-abịa n'Anambara - NEMA

Agbaala ọtụtụ mmadụ egbe na Toronto

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii chụpụrụ ndị mmadụ n'ogbe ahụ

Ndị uweojii Toronto nke mba Canada ekwuola na otu nwoke ji egbe gbagburu otu nwaagbọghọ ma merụọ mmadụ iri na atọ ahụ n'abalị ụnyaahụ.

Mgbọ egbe tụrụ ma gbagbuo nwoke ahụ dịka ụda egbe na-arị ibe ya elu.

N'egwuregwu:

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Christian Pulisic nyere ọkpụ goolu abụọ n'asọmpị ahụ mgbe Dortmund si n'azụ merie Liverpool

Otu Borussia Dortmund si n'azụ were ọkpụ atọ asatara otu merie Liverpool n'asọmpi International Champịọns Cup ha gbara ụnyaahụ.

Ndị otu Liverpool dịka Mohammed Salah, Sadio Mane esonyeghi gbaa asọmpị ahụ.

Nkeji nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụko ga-amasị gị ịko taa niile

Ihe Nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnyeoru Air Peace ji asụsụ Igbo atụziaka maka njem n’ụgbọelu si Legọọs na-aga Owere