Boko Haram: Kedụ mgbe agha a ga-ebi?

Ụlọ ndị Boko Haram gbara ọkụ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụlọ ndị Boko Haram gbara ọkụ

Dịka mwakpo ndị Boko Haram na-arị ibe ya elu na nso nso a, otu onye ogbunigwe mgbagbu onwe egbuola ndị mmadụ asaa na Borno Steeti.

Nke a mere n'isi ụtụtụ taa n'ime ụlọ okpukperechi ndị alakụba dị ọchịchị obodo Konduga nke Borno Steeti.

Onyeisi ndị nchekwa ọdịnala na mpaghara ahụ bụ Malam Ali Kolo gwara ndị ntaakụkọ na mmadụ asaa ndụ gụnyere nwata merụrụ ahụ.

O kwuru na onye Boko Haram ahụ mịbatara n'ụlọ okpukperechi ndị alakụba dị na Mainari mgbe ha na-ekpe ekpere ma toghee uwe ogbunigwe ya.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị agha Naịjirịa

N'okwu ya "Amaghị etu onye a siri bata n'ime obodo wakpoo ebe okpukperechi a."

"Ụlọ ahụ dakwara n'ihi mwakpo ahụ, mana ebupụla ozu ndị ahụ nwụrụ anwụ."

Image copyright Getty Images

Onyeisi ụlọọrụ gbatagbata na Steeti ahụ bụ Bello Dambatta kwuru na nke a bụ eziokwu na ndị merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ Maiduguri na-anata ọgwụgwọ.

Cheta na izụụka abụọ gara aga ndị Boko Haram wakporo ndị agha Naịjirịa n'ụzọ ma gbuo ọtụtụ n'ime ha.

Ndị agha Naịjirịa depụtakwara akwụkwọ ozi kwuru na ndị Boko Haram wakporo ọdọ ha nke dị na Babbangida, Yobe steeti n'ụbọchị satọde.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara