Saraki na Ekweremadu: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mgbochi ha

Saraki na Ekweremadu Image copyright Getty Images

Ka ndị mmadụ nụrụ na ndị EFCC gbochiri ndịisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki na Ike Ekweremadu ịpụ n'ụlọ ha n'ụtụtụ a, ha etinyela ọnụ na ya bụ okwu.

Uche Anichukwu bụ ọnụ na-ekwuchitere Ekweremadu, gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị EFCC gbochiri ya ịpụ maka na ọ kwesịrị ịnọchi Saraki dịka na nzukọ ụlọomeiwu taa.

Ebe onye enyemaka Saraki bụ Banks Omishore, tinyere na Twitter na EFCC nyachiri ihu ụlọ ya ka ọ ghara ịpụ.

Image copyright Uche Anichukwu

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia

Ndị Naịjirịa tinyere ọnụ na ya bụ okwu.

Ebe ụfọdụ kwuru na ọ bụ onyeisiala na-emegide Saraki, ndị ọzọ na-ekwu na ọ na-emegide ọkwa onyeisi ụlọomeiwu ukwu.

@atiku bụ onye chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala kwuru sị na ndị ọchịchị ekwesịghị ime ndị omeiwu ha ka ndị ohi.

@OgbeniDipo kwuru na ọ bụ Buhari na Saraki na-ama aka.

@Omojuwa kwuru na ọ bụ mkparị nye ọkwa onyeisi ụlọomeiwu.

@Ogundamisi kwuru sị na igbochi Saraki bụ imegide ọkwa ya.

@KelvinOdanz kwuru sị na-ejiri ego e ji achụ Saraki lekọta ezigbo mpụ dị n'obodo, na Naịjirịa ga-adị mma karịa etu ọ dị.

BBC Igbo jụrụ ndị na-agụ ha ihe ha che gbasara ihe na-aga, lee ihe ha kwuru:

Akụkọ ndị ga-amasị gị: