Akụkọ ndị dị mkpa: Ọkụ erepiala mmadụ 74 na Greece

Ebe foto si, Reuters
Ọkụ erepịala ihe karịrị mmadụ iri asaa na anọ nakwa ụgbọala ole na ole na mpaghara Attica na mba Greece.
Ndị ụlọọrụ kwuru na ha hụrụ ebe ozu ndị mmadụ makụrụ onwe ha wee nwụọ oge ọkụ ahụ nọchiri ha ụzọ ịgba ọsọ.
N'akụkọ ndọrọndọrọ ọzọ, BBC na-anụ na ndị ụlọomeiwu sinetị otu nari na itoolu agaala ụlọ osote onyeisi sineti bụ Ike Ekweremadu iji nye ya nkwado ma gwaa ya na ha kwụsị ya ike n'azụ.
Cheta na ndị EFCC gbochiri Ekweremadu ịpụ n'ụlọ ya n'ụtụtụ a n'Abuja.
Ebe foto si, @BolajiAbdullahi/Twitter
Ndị ụlọomeiwu ukwu sineti mmadụ iri na ise gunyere Dino Melaye, Rabiu Kwankwaso hapụrụ otu APC gafee PDP na ADC taa.
N'otu aka ahụ, mmadụ iri atọ na asaa nọ n'ụlọomeiwu nta pụkwara na pati apc wufere na PDP nakwa ADC .
Mana otu APC ekwuola na pati ha kwụsịrị ike.
Messi, Ronaldo, Salah, Mbappe nakwa Midric esorola na ndepụta aha FIFA mere iji gosi ndị nwere ike irite nturuugo 'ọkachasị agba bọọlụ n'ụwa niile'
Gee akụkọ nke taa n'ime otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe onyonyo nke taa
Onyeoru Air Peace ji asụsụ Igbo atụziaka maka njem n’ụgbọelu si Legọọs na-aga Owere
Vidio, Onyeọrụ Air Peace ji asụsụ Igbo atụziaka maka njem n’ụgbọelu si Legọs na-aga Owere, Duration 0,45
Ndị ụlọọrụ Air Peace nabatara onye ọrụ ha ji asụsụ Igbo ama ọkwa n'ime ụgbọelu