APC na-akwụ ụgwọ ọchịchị nchịgbu ha na-achị - Ọkachamara

Buhari na Saraki Image copyright Getty Images

Ihe mere n'afọ 2014 na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa emegharịala ọzọ.

N'afọ 2014, ụfọdụ ndị otu pati PDP tiri mkpu na PDP anaghị achị ha nke ọma nakwa na a na-akpapụ ha akpapụ mana ọ dịka PDP egeghị ntị.

Nke mere ha ji nukoro baa pati ọhụrụ bidoro oge ahụ bụ APC, nke kpokobara iji chutuo onyeisiala oge ahụ bụ Goodluck Jonathan.

Otu ihe ahụ mere mbụ emeela ọzọ maka na ụfọdụ ndị mmadụ ọkachasị ndị nọ n'ụlọmeiwu nọ na pati APC etiela mkpu na a na-akpapụ ha akpapụ nakwa na pati ahụ anaghị achị ha nke ọma; ha anaghịkwa emezu nkwa ha kwere ụmụ Naịjirịa.

Mana ọ dịkwa ka ndị APC egeghị ntị, otu ihe ahụ PDP mere, nke kpatara mmadụ 15 n'ụlọ omeiwu sineti na mmadụ 36 si n'ụlọ omeiwu nta nọ APC jiri wụọ ọsọ 'Ben Johnson' gbaba na PDP nakwa pati ndị ọzọ.

Otu onye bụ ọkachamara na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Fidelis Edeh, gwara BBC Igbo na APC kpatara nkụ arụrụ mere ngwere ji pụtara ha ọrịrị.

O kwuru na ihe kacha ewute ya bụ na ndị ọchịchị anaghị achịta nke ọma.

O kwuru na ndị ọchịchị anaghị eleba anya n'ebe ndị ha na-achị nọ.

N'okwu ya; "Ihe mere taa gosiri na ọchịchị anyị ugbua, onye ọbụla ka na-azọ isi onwe ya.

"Kamgbe ọchịchị laghachitere n'aka ndị nkịtị, ọ dị ka ebe anyị nọbu ọ ka mma."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionFidelis Edeh

N'akụkụ nke ya, onye ọzọ ọnụ na-eru n'okwu gbasara ndọrọndọrọ bụ Sam Olisa, kwuru na ihe mere gosiri na otu pati APC amụtaghị ihe ọbụla n'ihe mere otu pati PDP n'afọ 2014.

N'okwu ya; "Ọtụtụ ndị mmadụ ga na-eche na ọ bụ maka onwe ha mana echeghị m na ọ bụ maka onwe ha maka na onye ọbụla ruru ọkwa omeiwu na Naịjirịa abụghị obere mmadụ ga na-eme ihe maka ihe ndị chere.

"Eche m na ọ bụ maka na ndị ndu pati ha egeghị ha ntị mana si akpafu n'ụzọ ha kwesiri ịnọ, ala anyị na onwe ya na-apụkwa n'ụzọ, ọkachasị ihe gbasara nchekwa.

"Ọ bụ ọrụ gọọmentị na mba niile ichekwa ndị ha na-achị mana oge gọọmentị otu pati na-agwa ndị ha na-achị otu ihe maọbụ ihe ọzọ na ha echekwanwughi ndụ ndị mmadụ, ị mara na ihe mere taa bụ maka na ndị nọ pati ahụ anọkwataghịzi.

"Eche m na ihe mere taa dị mma maka ọchịchị onye kwuo uche ya."

O kwukwara na agaghị ahụkwa mgbanwe ọbụla n'aka ndị pụrụ maọbụ ndị nọ maka na pati niile nọ Naịjirịa bụ otu, "ha niile enweghi nke nwere ezi atụmatụ na-achị ha."

Otu ihe dị mkpa ịmata bụ na 2019 na-abịa ma pati niile na-achọ ịbụ ndị ga-enwe mmeri.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị si APC lọghachite PDP alụọla nwaanyị abụọ mara nke ka mma - Uzochukwu

Anyị niile nọ n'ebe APC nọ ugbua na-ajụ ma ihe mere PDP na ntuliaka 2015 ọ ga-emekwa ha?

Akụkọ ga-amasị gị: