Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: CAF na-ajụ ihe mere Afrịka emeghị nke ọma n'Iko Mbaụwa
Gịnị mere otu Afịrịka agbaghị nke ọma n'Iko Mbaụwa - CAF
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ọhụrụ nke otu CAF bụ Ahmad Ahmad, ekwuola na oge eruola ka ndị na-elekọta otu bọọlụ dị iche iche na mpaghara Afrịka zara ajụjụ ịchọpụta ihe mere otu dị iche iche si Afrịka agbaghị nke ọma n'asọmpi Iko Mbaụwa.
Ebe otu Everton ji nde pounds iri ise zụrụ ọgba bọọlụ Richarlison.
APC kwụsịrị ike - Buhari
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na otu pati ha bụ APC kwụ chịm n'agbanyeghị na ọtụtụ ndị omeiwu apụọla gawa PDP na ADC.
Buhari kwukwara na onweghị ihe ọjọọ o bu n'obi gbasara ndị a pụrụ.
Titus Uba bụ onyeisi ọhụrụ ndị omeiwu Benue steeti
Ebe foto si, Titus Uba Facebook
Ndị omeiwu Benue steeti ahọpụtala Titus Uba dịka onyeisi ọhụrụ ha.
Nke a mere dịka ndị omeiwu na steeti a ruru iri atọ binyere aka n'akwụkwọ ịchụtụ Terkimbi Ikyange dịka onyeisi ha.
Ha boro Ikyange ebubo isi ike nakwa iji ọkwa ya emegide ndị omeiwu ibe ya na steeti ahụ.
Ha ka na-achọ ndị mmadụ na Greece
Ebe foto si, Getty Images
Na mba ofesi, ndị gbatagbata ka na-achọ ndị dị ndụ n'ebe ọkụ gbagburu mmadụ ruru iri asaa na anọ na mba Greece.
Onyesisiala ahụ kwuru na ha ga-eji ụbọchị atọ wee ruo uju.
Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a
BBC Nkeji
Lee ihe nkiri anyị
Nsọala n'obodo ụfọdụ n'Igbo