Ọkụ latrik agaghị enwu ọfụma ruo afọ 2023 - Ndị ọrụ latrịk

Ọkụ ukpe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ọtụtụ ebe n'ala Igbo enweghi ọkụ afọ ruo afọ

Ndị na-eke ọkụ latrịk na Naịjirịa a kpọrọ 'Nigerian Electricity Distribution Companies' na bekee ekwuola na ọ ga-ahịa ahụ ike ọkụ latrịk na Naịjirịa nke ọma ugbua n'ihi ụgwọ ha ji ndị ụlọakụ kara nkụ.

Ha kwuru na ọ bụghị na gọọmentị abanyeghị n'okwu a n'ike, nsogbu nwere ike iru afọ 2023 tupu o bie.

Ndị ọrụ a ha na-akpọ Discos n'ichafu kwuru na ugbua, ọtụtụ ndị ọrụ ha emechiela ụlọọrụ ha maka na ego ha-anata ndị mmadụ dịka ụgwọ ọkụ erughị ego eji azụ ọkụ a.

Ha kwuru na nsogbu a bụ ihe na-emetụta ha niile n'ala a.

BBC Igbo gbara ọnụ na-ekwuchitere ndị ụlọọrụ Ikeja Distribution Company bụ Felix Ofulue ajujụọnụ gbasara nsogbu a, o kwuru na ndị ọrụ ike ọkụ latrịk na Naịjirịa nọrọ n'etịtị ọkụ na osimiri.

Gịnị bụ nsọgbu ha?

Ofulue kọwara na iwu gọọmentị kpebiri na ha agaghị ewelite ụgwọ ọkụ cha cha na-egbu ụlọọrụ dị iche iche na-eke ọkụ latrik na Naịjirịa maka na ego ọrụ e ji emeputa ọkụ latrịk arịala elu.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Gainji Dam bụ ebe ama ama na-amipịta ọkụ na Naịjirịa

Ofulue kwuru: "Cheta na ego ịzụ mmanụ gaas arịala elu. Ebee ka anyị ga-ahụ ego ịrụ ọrụ ma ọ bụrụ na ndị mmadụ anaghị akwụ ụgwọ ọkụ?"

Onye ọzọ aha ya bụ Okey Okere bụ ọkachamara n'ihe gbasara ọkụ latrik kọwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ndị na-eke ọkụ na Naịjịrịa na-ata ahụhụ.

Mana o kwuru na ọ bụghị iwelite ụgwọ ọkụ ga-ebi nsogbu a.

N'ọnụ okwu ya: "Oge eruola ka ndị Discos tinye ego na ngwa ọru ha."

Mana Naịjirịa ọ ga-echenwu afọ 2023?

Ihe a bu nke na-agbakasị ndị mmadụ isi.

Stephen Mbonu gwara BBC Igbo na ihe a pụtara na ite nsogbu ka na-asụ pụtụpụtụ n'ike Naịjirịa.

Okere kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti emeghị ka ndị mmadụ nkiti tinye aka n'ọrụ ike ọkụ na Naijirịa, nsogbu a ga-adị ruo ebiebi.

Akụkọ ga-amasị gị