Ị nwere ike ịgba ara ma ị nweta onwe gị n'ụlọ mkpọrọ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionUle ụlọ mkpọrọ

Ụlọ mkpọrọ na mba ndị ọzọ bụ ebe a na-ahazi ndị mmadụ ma mezie agwa ha iji weghachite ha n'ime obodo dịka ndị gbanwere agbanwe.

Mana ọtụtụ ndị na-eleta ndị mkpọrọ ekwuola na ụlọ mkpọrọ na Naịjirịa anọghị nso ịbụ ebe mmezi maka ụfọdụ ihe ha kpọpụtara.

Onyeisi otu na-eleta ndị mkpọrọ a na-akpọ Carmelite Prisoners Interest Organisation (CAPIO) na Bekee bụ Fr. Ambrose Ekeroku, gwara BBC na ọnọdụ ụlọ mkpọrọ na Naịjirịa bụ nke na-agba anya mmiri.

Fr. Ambrose kwuru na ihe ruru mmadụ 60 n'ime ụlọ mkpọrọ n'Enugwu bụ ndị isi na-adịghị mma.

O kwuru na ụdị ndị ahụ nọ n'ogige a rụpụtara ndị isi adịghị mma nọ n'ime ụlọ mkpọrọ nke a kpọrọ 'Asylum' na Bekee.

Fr. Ambrose kwuru na ihe dị mwute karịa bụ na ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ enwetabeghi ezigbo nri ma ya fọdụ inweta ọgwụgwọ maka ndị isi mgbaka.

O kọwara na ọnọdụ ndị nọ na mkpọrọ nọ abụghị ihe dị mma cha cha nke anaghị aba uru ha chọrọ ka ọ baa maọbụ gbanwe ndị nọ n'ime ya.

Image copyright CAPIO
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ụlọ mkpọrọ na Naịjirịa dị njọ karịa etu a

N'okwu ya: "Ọtụtụ ụlọ mkpọrọ dị na Naịjirịa bụ nke ndị ọcha rụrụ nke kwesiri ibu mmadụ 600.

"Mana ugbua, ha na-ericha mmadị 30,000 nke bụ na ebe niile kpara mkpa karịa.

"Ị gaa ebe ahụ, ị hụ ka ebe niile na-esi isi, ọnọdụ mkpocha na nzacha adịghị mma, mmiri adịghị.

"Ọtụtụ ihe ga-eme ka mmadụ nwee isi mgbaka ebe ahụ."

Image copyright CAPIO

Ihe nwereike ibutere ndị nọ na mkpọrọ isi mgbaka

  1. Echiche: Otu ihe Fr. Ambrose kwuru bụ na oke echiche nwere ike ime ndị nọ n'ime ụlọ mkpọrọ e nwee nsogbu n'isi nwere ike ibute isi mgbaka
  2. Amaghị mgbe ị ga-ala: Ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ụlọ mkpọrọ na Naịjirịa bụ ndị amaghị ụbọchị ha ga-ala maọbụ ụbọchị a ga-ekpe ikpe ha.
  3. Ndị isi gbakara tupu ha abata: Fr. Ambrose kọwakwara na ụfọdụ ndị isi mgbaka bụ ndị ụmụnne ha kpọtara n'ụlọmkpọrọ maka na ha achọghị ka ọha mara na nwanne ha nwere isi mgbaka. N'okwu ya; "Ị ma na ọ bụ ihe ndị mmadụ ga na-akpa oke ma ha mata na nwanne gị nọ n'ụlọọgwụ ndị isi mgbaka, nke mere na ọ bụrụ na mmadụ chọpụta na nwanne ya nwere isi mgbaka, ha agaa nweta akwụkwọ n'ụlọikpe ka a kpọga ha nga na ha bụ ndị ohi isi mgbaka nke a na-akpọ 'Criminal Lunatic".
  4. Ọtụtụ ndị nwere isi mgbaka bụ site n'ihe a na-ese n'ọnụ dịka igbo na ọgwụ ike ndị ọzọ.

Ọ kọwarana ụdị ndị a anaghị aga n'usoro ikpe maka na ndị nwe ya chọrọ ka ọ nọrọ ebe ahụ.

Dịka o si kwuo, ndị nọ na mkpọrọ nwere isi mgbaka na-anọ iche n'ebe ndị ọzọ nọ mana ajụjụ bụ kedụ ka ha si enweta ọgwụgwọ?

Image copyright CAPIO

Kedụ ka ndị isi mgbaka si ebi n'ụlọ mkpọrọ?

Ndị nwere isi mgbaka nọ n'ụlọ mkpọrọ na-anọ n'ime ụlọ nke ha dị iche na mkpọrọ niile. Fr. Ambrose kwuru; "Ha nwere mgbidi nke ha, nwee mgbo nke ha dịka "mkpọrọ n'ime mkpọrọ".

O kwuru na ha anaghị enweta ọgwụgwọ ọbụla na-abụghị nke ndị otu ha bụ CAPIO na-arụ ọrụ enyemaka n'ụlọ mkpọrọ site na ndị dibia bekee ha na-akpọta na-enye.

O nweghizi ọgwụgwọ ha na-enweta maka na ha anaghị eri nri nke ọma, ya fọdụzie inweta ọgwụgwọ.

N'okwu Fr. Ambrose."Ọgwụ ndị isi mgbaka na-agara ọnụ nke ukwu, maa gọọmenti enyebeghị ha ezigbo nri, ma ya fọdụzie ọgwụ ndị ahụ."

N'akụkụ nke ya, otu onye na-arụ n'otu a na-akpọ Clara Innocent onye ọrụ CAPIO gwakwara BBC Igbo na e nwere dọkita maka isi na-anọ n'ụlọ mkpọrọ mana o nweghị ngwọrụ o ji arụ ọrụ.

Ọ kọwakwara na otu ha na otu ndị ọzọ na-agbọ ịleta ndị mkpọrọ n'ụzọ kwesiri ekwesi.

BBC Igbo gbara mbo inweta ngalaba gọọmenti na-ahụ maka ụlọ mkpọrọ mana ọ gaghị nke ọma.

BBC Igbo gara ileta ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ n'Ikoyi Lagos ebe ha lere ule UTME ma jụta kwa ha ihe bụ ọdịnihu ha n'afọ a.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionUle ụlọ mkpọrọ

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara