O nwere mmụọ bi na nwata bu isi dada pụta ụwa?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo N'oge gboo, Igbo nwere nkwenye na ndị bu isi dada nwere ike ime anwansi

Akwa nwata ọhụrụ n'ụlọ ọbụla na-ebute nnukwu ọṅụ n'obi onye ọbula.

Mana o nwere ụfọdụ ebe n'ala Igbo ebe nwata ọhụrụ a mụrụ buru isi dada nwere ike ịbute egwu.

Ndị obodo a dịka Igbuzo(Ibusa) n'ime Delta steeti , ebe a na-ahụ ụmụaka bu dada dịka ndị pụrụ iche.

Onye bụ onye isi dada?

Akụkọ ụfọdụ kọwara na nwata a mụrụ ọhụrụ buru isi dada bụ maka na nne ya rịọ otu mmụọ bi n'ala a arịrịọ ka o nye ya nwa.

Ha nwere nkwenye na isi dada bụ akara ndị mmụọ kara nwata ahụ nke ha ga-eji mara ya.

Ha na-akpọ ụmụaka a 'Ezenwa'.

Ha nwere nkwenye na isi dada ha bụ okpueze ha.

Dịka ka ha siri nwe nkwenye, nwata buru isi dada ga-abụ nwata ga-eme nke ọma n'ụwa maka na chi ya kwụsiri ike n'akụkụ ya, ha na-esi ezigbo ike, nakwa na ha ga-eto buru dike na-ebute nnukwu egwu n'oge agha.

Mana ọtụtu nsogbu na-eso ndi bụ isi dada.

Nkenke aha onyonyo Ọ na-afịahụ ị lekọta isi dada nke ọma

Nsọ sonyere n'isi dada

Ọtụtụ n'ime ndị ọbọdọ a, nwere nkwenye na nwata buru isi dada ga-arịa nnukwu ọrịa maọbụ nwụọ ma ọ bụrụ na mbọisi banye na ntụtụ ya.

Ọ bụ arụ imetu aka na ntutu onye bu isi dada.

Onye ọbụla mere udi ihe a kwesiri inye nwata ahụ ego n'aka ngwa ngwa ma ọ bụ kedo ego ayọrọ n'isi ya.

Sọọsọ emume a ga-akwụsị nwata ahụ ịrịa nnukwu ọrịa.

Ọ bụ sọọsọ nne nwata ahụ nwere ike ịmetụ ntụtụ nwata a nwere isi dada aka.

Emume okpukpe ịkpụ isi dada

Akụkọ kwuru na ọ bụ ndị dibia na-akpụ isi nwata buru isi dada.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ugbua ndị ama ama n'ihe onyonyo na kwa ọtụtụ mmadụ ji isi dada eme ịnyanga

Nwata ahụ ga-atoola eto, bụrụ nwata na-ekwu okwu.

Ezinaụlọ ya ga-ajụ ya ihe ọ chọrọ ka eji nwere kpụ ya isi dada ya.

Ihe niile ọ chọrọ n'ụbọchi ahụ ka ha ga-enye ya.

Uka Kraist

Ala Igbo niile bụ ebe okwukwe ndị otu ụka Kraist kwusiri nke ọma. Ihe a emeela ka ọtụtụ omenaala Igbo gbanwe agbanwe.

Ugbua ọtụtụ ndị umụafọ Igbo ekweteghị na ajọ mmụọ bi n'ịme nwata ọbụla buru isi dada pụta n'ụwa.

Mana ha ka na-akpọrọ ụdị nwata ahụ gawa ụlọụka ka ndị ụkọchukwu mere ya ekpere.

Dọkịta Anthony Mgbolu gwara BBC Igbo na isi dada bụ ihe na-esite na agbụrụ ezinaụlọ ahụ.

Ihe omenaala Igbo kọwara maka ndị isi dada

Ọkachamara n'ihe ọmụmụ gbasara Afrịka na asụsụ na Mahadum University of Lagos bụ Chiagozie Nnabuihe kọwara BBC Igbo na ala Igbo n'oge gboo enweghị nkwenye ọbụla gbasara ndị bu isi dada.

Nnabuihe kwusiri ike na ọ bụrụ na Igbo n'oge gboo nwere nkwenye n'isi dada ha kwesiri inye ya aha.

N'ọnụ okwu ya: "Dada bụ aha ndị yoruba nyere ya. Ndị Igbo na-asọ isi dada bụ maka a ha na ndị Yoruba enweela mmekọrịta."

Mana isi dada ọ bụ ihe ọjọọ n'ezie?

Image copyright Nnamdí Daniels
Nkenke aha onyonyo Nnamdi Daniels bụ onye na-eme ihe nkiri

Ọtụtụ ndị mmadụ anyị gbara ajụjụ ọnụ kwuru na o nweghị ihe ọjọọ dị n'isi dada mana n'ezi e, ọtụtụ mmadụ ka na-ele ndị bu isi dada dịka ndị na-eme agwaa ọjọọ.

Nnamdi Daniels bụ nwoke bu isi dada gwara BBC Igbo na ọ hushiela anya maka mkparị ha na akparị ya maka isi dada ya.

N'ọnụ okwu ya: "Echetera'm otu oge m mere njem gawa mahadum nke Niger Steeti. Onye nchekwa bidoro ịgba m ajụjụ gbagwojuru m anya maka isi dada m. Ihe a butere m nnukwu ihere."

Isiokwu Ndị Emetụtara