Buhari na ndị sinetọ APC ga-enwe ọgbakọ n'abalị a

Buhari na Saraki

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị sinetọ fọrọ na otu APC ga-enwe ọgbakọ n'abalị a.

Nke a na-abịa na-emebeghi otu ụbọchị ọtụtụ ndị sinetọ na na ndị omeiwu nta bụbụ ndị APC gbara pati ahụ alụkwaghị m banya na PDP nakwa na pati ADC.

O doghị anya ihe ọgbakọ ahụ ga-abụ maka ya mana ndị mmadụ na-ekwu na ọ ga-abụ ka ha ahazigharịa atụmatụ ha ebe ọ bụ na ọnụọgụgụ ha na-agbadazi.

Agbanyeghị na onyeisi ụlọomeiwu sineti ekwubeghị na ya agafela na pati ọzọ, odoghị anya ka ọ ga-eso n'ọgbakọ ahụ ga-eme n'abalị a.

Ka mwufe mere ụnyaa mesiri, ọtụtụ na-ekwu na PDP ewerela oche karịrị n'ụlọomeiwu sineti mana ndị APC ka nwekarịrị ọnụọgụgụ mana onweghị onye ma ka mmiri ezosiela na ya bụ ụlọ.

Pati ahụ dere n'akara twitter doo onye ọbụla anya na ọnụọgụgụ ha ka riri nne.

N'aka nke ọzọ, ihe onyonyo pụtara na twitter ebe ndị otu Rabiu Kwankaso na Kano na-akpọ azịza ha ọkụ nke gosiri na ha na-achụpụ pati APC

Akụkọ ndị ga-amasị gị: