Codeine: Ndị ọrụ kọstọm akpachiela katọn 498

Ndị ọrụ kọstọm

Ebe foto si, Federal operations unit, Ikeja, south west

Ndị ọrụ kọstọm kpachiri kọntena atụbatara atụbata bu ọgwụ ụkwara codeine karịrị katọnụ 498 na Legọs echi gara aga.

Ngalaba na-ahụ maka mbupu na mbubata ngwaahịa na Naịjirịa a na-akpọ Kọstọm, kwuru na ha kpachiri ụgbọala bu ya bụ ọgwụ n'ụzọ Ijebu-Ode dị n'Ogun steeti.

Ha kwuru na ihe karịrị katọnụ 498 ahụ ha kpachiri ruru nde narị abụọ ma e ree ya.

Ndị Kọstọm ahụ nke Muhammad Uba Garba bụ onyeisi ha, kwuru na ha nụrụ kepu kepu na ndị ahụ bu ọgwụ ọtọmegbum ahụ abata, chụrụ ha gawa.

Ha chukwudoro ha ma nwụchie ma ọkwọụgbọala ma onye nwe ya bụ ụgbọala.

Cheta na ndị ọụ BBC gara jiri aka ha mee nyocha ebe ha chọpụtara etu ọgwụ ụkwara nwere codeine si anyụ ndị mmadụ na-aṅụbiga ya oke anya.

Lee ihe nkiri gbasara ya ebe a.

Aha onyonyo,

Codeine, ọtọmegbum

Akụkọ ndị ga-amasị gị: