Ụlọikpe dị n'Amerịka tupụrụ ikpe ndị IPOB n'ụlọikpe ha

Ipob chọrọ iketa ego Abacha Image copyright Getty Images

Ndị otu Ipob si n'aka otu ụlọikpe dị na 'District of Columbia' (DC) na mba Amerịka kpụpụ gọọmentị etiti Naịjirịa ụlọikpe mbaụwa ka ha kwuru na ha kwesịrị iketa pasentị 40 n'ego Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Abacha zupuru.

Ụlọikpe ahụ tupụrụ akwụkwọ ikpe a site n'aka Ọkaikpe Dabney Friedrich, maka na o kwuru na ha enweghị ụdịrị ikike ahụ maka na ndị gọọmentị Naịjirịa nwere iwu nnwereonwe na mba ofesi, nke Bekee kpọrọ 'foreign immunity'.

Ipob gbara akwụkwọ a site n'aka Ọkaiwu Godson M. Nnaka bi obodo Texas, nakwa ndị ọkaiwu ibe ya, ka ha kwuru na ha chọrọ pasentị 40 n'ime nde dọla 550 anatara n'ego Abacha zuru.

Ndị ha kpọrọ aha n'akwụkwọ a ha gbara gụnyere onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Lieutenant General Tukur Buratai, onyeisi ndị SSS bụ Lawal Daura, onye bụbu onyeisi ndị uweojii bụ Solomon Arase nakwa onye nọchitere ya bụ Ibrahim Idris.

Ndị ọzọ bụ gọvanọ Abịa bụ Okezie Ikpeazu na nke Anambara bụ Willie Obiano.

Ipob gbara akwụkwọ a n'Amerịka, ebe ha kwuru na a na-emegide ikike ha nwere dịka mmadụ, na-egburu ndị otu ha nakwa mekpaa ndị otu ha na-eme ngagharịiwe ahụ n'etiti 2016 na 2017.

Ọ bụghị ụlọikpe mbaụwa dịka anyị deburu na mbụ, kama ọ bụ ụlọikpe dị n'Amerịka.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a