"Buhari oge mgbanwe eruola" - Fr. Mbaka

Ụkọchukwu Ejike Mbaka Image copyright Adoration Ministry/ Getty Images

Ụkọchukwu a ma ama bụ Rev Fr. Ejike Mbaka ezigarala onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ozi na 'iwe Chineke adịla ọkụ n'ebe ọ nọ maka ọchịchị ya'.

Fr. Mbaka ji oke iwe baara Buhari mba na ọ gbara nkịtị a na-egbu ụmụ Naịjirịa ka ha a bụ anụmanụ.

Ọ rụrụ Buhari aka ma kwuo na ọchịchị ya bụ 'demon-cracy' kama 'democracy' n'ihi na o meghi ka onye nkwafu ọbara mmadụ na-emetụta n'ahụ.O kwuru na oge eruola mgbe Chineke ga-ewepụ mkpara onye iro bụ ekwensu n'ala ụmụ ya na Naịjirịa.

Mbaka wepụtara ozi a oge ọ na-ezi oziọma ụbọchị ụka gara aga n'Adoration o mere n'Enugwu steeti, nakwa ekpere o mere n'ụbọchị gara aga a kpọrọ "I no dey again" na Bekee.

Ọ kpọrọ ozi nke o zisara n'ụbọchị ụka 'Disaster is coming', ebe nke ụbọchị garaga bụ 'Change is coming'.

Ka ọ na ekwuputa ya bụ amụma, Mbaka ji egwu na mkpu akwa kwuputa na ọbara ndị ụkọchukwu abụọ egburu na Benue steeti nakwa ndụ ndị mmadụ ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchịehi lara n'iyi, abụrụla amamikpe dịịrị gọọmenti nọ ugbua.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBuhari ga-achịrịrị ọzọ -Wogu

Mbaka gwara onyeisiala na ebe ọ bụ na ọrụ adighị, ọkụ latrik adighị, ọ naghị akwụsị ikwafu obara ndị a na-enyo na ha bụ ọchịehi na ndị ọzọ na akwafu, na o kwesịghị ị na-arahụzi ụra ugbua maka na "oge mgbanwe eruola".

Mbaka gbarụrụ ihu ma kwuo na ndị ọchịchị niile nọ ugbua bụ otu ndị ahụ gburu Naịjiria, ha bụ agada gbachiri ụzọ na-ekweghị ka ndị ga-edozi obodo bata.

N'ihi nkea, o kwuru na eluigwe enyochaala gọọmentị Naịjirịa wee chọpụta na ọ na-eri nnukwu mperi.

O mechiri okwu ya site n'ikwu na onweghị okpukperechi ga-agbapụrụ ibe ya na Naịjiria.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a